Ịga Eluigwe ka ọ̀ bụ Hell?
“OLEE ohere ndị i nwere ịga eluigwe ma ọ bụ ịga hell?”
N’ụzọ bụ isi, a jụrụ ole na ole ndị America ajụjụ ahụ n’otu nnyocha e mere n’isi nso a. Ụlọ ọrụ Princeton Religion Research Center bipụtara ihe sitere na ya n’akwụkwọ bụ́ Religion in America 1992-1993.
Olee otú ị gaara esiwo zaa? Olee ohere e nwere na di ma ọ bụ nwunye gị ma ọ bụ ndị ọzọ ị hụrụ n’anya ga-aga eluigwe mgbe ha nwụrụ? Ì chere na ọ pụrụ ikwe omume na gị, ma ọ bụ ha, pụrụ imesịa gaa hell?
Nnyocha ahụ gosiri na 78 pasent chere na ohere ha nwere ịga eluigwe dị mma ma ọ bụ magbuo onwe ya, ihe karịrị ọnụ ọgụgụ ndị na-aza otú ahụ ihe dị ka 40 afọ gara aga. Hell? Ihe dị ka 77 pasent kwuru na ohere nke ịga ebe ahụ dị nnọọ ntakịrị.
Nzaghachi ha hà dabeere n’ezi ihe ọmụma nke Bible? Ọ dị mma, ihe dị ka 4 n’ime 10 kwetara ịga ememe okpukpe ugbo ole na ole na-erughị ka ha gara n’afọ ise gara aga. Nanị 28 pasent kwuru na ha na-ekere òkè n’ìgwè ọmụmụ Bible dị iche iche, 27 pasent kwa na klasị ndị na-enye nkụzi okpukpe.
Ọ bụrụ na i jiri nlezianya mụọ Bible, ị ga-achọta ụfọdụ ihe ndị na-eju anya bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwu hoo haa na mgbe ọ nwụrụ, Jisọs gara “hell,” dị ka nsụgharị ụfọdụ nke Bible si dị. (Ọrụ 2:31, King James Version; “Hedis,” New World Translation) Okwu Chineke na-anwapụtakwa na ma Eze Devid ma Jọn Baptist adịghị nke gara eluigwe mgbe ha nwụrụ. (Matiu 11:11; Ọrụ 2:29) Ndị ahụ bụ ihe ndị bụ eziokwu, ọ bụghị nanị echiche ndị sitere ná nnyocha okpukpe.
Ihe ndị ọzọ bụ eziokwu pụrụ imetụta gị bụ: Bible na-akụzi na a ga-ewere ndị ozi Jisọs na ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị ọzọ gaa eluigwe iso Jisọs chịa achị. Otú ọ dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụ mmadụ bụ́ ndị nwụworo gara nanị n’ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. Chineke ga-akpọlite ha n’ọnwụ, na-eweghachite ha ná ndụ n’elu ụwa na-enwe olileanya nke ndụ juru eju, nke obi ụtọ, nke na-enweghị ọgwụgwụ n’elu ụwa paradaịs.
Ọ ga-amasị Ndịàmà Jehova inyere gị aka ịchọpụta site na Bible nke gị ihe ndabere ziri ezi maka olileanya ahụ.