“Ka Anyị Gụkwuo Ihe Tupu Anyị Akwawa Emo”
NKE ahụ bụ ihe otu onye si New Zealand kwuru banyere Ụlọ Nche, magazin nke a ị na-agụ. Banyere otu isiokwu maka ụgbọ ala eluigwe ịnyịnya na-adọkpụ nke Chineke nke a kọwara n’Ezikiel isi 1, onye ahụ dere, sị:
“Nke ọ bụla n’ihe anọ ndị a dị ndụ e kere eke, ma ọ bụ ndị cherub, nwere nkù anọ na ihu anọ. Ha nwere ihu ọdụm, na-egosi ikpe Jehova; ihu oké ehi, na-anọchite anya ike Chineke; ihu ugo, na-egosipụta amamihe ya; na ihu mmadụ, na-egosi ịhụnanya Jehova.
“Mgbe m gụsịrị nke a ugboro ugboro, m nwere mmetụta na-ekpo ọkụ n’ime obi m. Anya mmiri gbara m, anya mmiri nke ọṅụ. Echiche bịara m n’ime ozugbo bụ, ‘Lee ka ị na-aghaghị isi maa mma, dịkwa ụtọ, Jehova!’ Onwe m enyeghị m ọnụ okwu maka mmetụta ọhụrụ ndị a n’ebe Jehova Chineke nọ bụ́ onye m kwaworo emo ruo ọtụtụ afọ, ebe m bụ nnọọ onye ụwa. M na-asị Ndịàmà Jehova ‘ekele m unu,’ nyekwa ọtụtụ ndị dị ka m, m na-asị, ‘Ka anyị gụkwuo ihe tupu anyị akwawa emo.’”