Anyasị A Ga-echeta
N’ỤBỌCHỊ kwesịrị ncheta ihe karịrị 3,500 afọ gara aga, Jehova Chineke mere ka ndị Israel nọ n’ohu n’Ijipt gbuo nwa atụrụ ma fesa ọbara ya n’awara ụzọ na n’elu ofiere ụzọ nke ụlọ ha nile. Kpọmkwem n’abalị ahụ, mmụọ ozi Chineke gabigara ụlọ nile a kara akara n’ụzọ dị otú a ma gbuo ụmụ ndị ikom nile e buru ụzọ mụọ n’ụlọ ndị Ijipt nile. Mgbe ahụ, a tọhapụrụ ndị Israel. Eri mgbe ahụ, n’ụbọchị ihe omume ahụ gbara afọ, ndị Juu na-eme Ememe Ngabiga ahụ.
Ozugbo Jisọs Kraịst mesịrị Ememe Ngabiga ya nke ikpeazụ ya na ndị ozi ya, o guzobere oriri nke ga-echeta ọnwụ ịchụ àjà ya. O nyefere ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi achịcha ma sị: “Naranụ, rie; nke a bụ ahụ m.” O nyekwara ha iko mmanya ma sị: “Unu nile ṅụọ n’ime ya; n’ihi na nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ, nke a na-awụsiri ọtụtụ mmadụ ka e wee gbaghara mmehie.” Jisọs kwukwara, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Matiu 26:26-28; Luk 22:19, 20) Otú a Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-eme ncheta nke ọnwụ ya.
Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù isonyere ha n’ime Ememe Ncheta nke a nke ọnwụ Jisọs. Ị pụrụ ịga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kasị dịrị ụlọ gị nso. Jụọ Ndịàmà nọ n’ógbè gị maka kpọmkwem oge na ebe a ga-eme ya. Ụbọchị ememe ahụ na 1994 bụ Saturday, March 26, achịcha na mmanya ahụ bụkwa ndị a ga-ebugharị mgbe anyanwụ dasịrị.