Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 4/1 p. 32
  • Ha Na-abịakọ ọnụ ruo Afọ Iri!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Na-abịakọ ọnụ ruo Afọ Iri!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 4/1 p. 32

Ha Na-abịakọ ọnụ ruo Afọ Iri!

MGBE a jụrụ ya mmetụta o nwere afọ iri gara aga mgbe a malitere ibipụta Ụlọ Nche nke Spanish n’otu oge ahụ ya na nke Bekee, otu ezi nwanna nwanyị bụ́ onye Spain zaghachiri: ‘Anyị chere na ọ bụ ngọzi n’ihi na anyị na ndị na-asụ Bekee bụzi otu, olee otú unu si asụ ya, ụkwụ na ụkwụ. Mgbe m na-ekwu Bekee, m na-eburu n’uche mgbe nile banyere ọgbakọ a. Anyị na-ezo aka n’ọgbakọ a dị ka “Mama.” Anyị na-enwe mmetụta nke ịnọ nso, ịdị nso. Ọ mara mma. Ọ bụ ihe dị ịtụnanya!’

Nwanna nwanyị a kwesịrị ntụkwasị obi kwupụtara echiche ọtụtụ ndị na-agụ akwụkwọ n’asụsụ na-abụghị Bekee. N’afọ ndị gara aga, isiokwu dị iche iche na-apụta n’Ụlọ Nche ná mbipụta Spanish mgbe ihe dị ka ọnwa isii gasịrị e bipụtara ha n’asụsụ Bekee. Asụsụ ndị ọzọ nwekwara ụdị igbu oge ndị a. N’ụzọ a pụrụ ịghọta, e nwere oké ọchịchọ ibipụta otu isi ihe ahụ, n’otu mgbe ahụ, n’ime ọtụtụ asụsụ.

Ya mere na-amalite ná mbipụta nke April 1, 1984, mbipụta nke Spanish bụ nke mbụ a malitere ibipụta ya na nke Bekee n’otu mgbe. Asụsụ ndị ọzọ sochiri n’oge na-adịghị anya. Ka ọ na-eru mmalite nke 1985, mbipụta na 23 asụsụ malitere ịpụtakọ ọnụ. Ka a na-achọta ma na-enye ndị nsụgharị ọzụzụ, mbipụta n’ọtụtụ asụsụ ndị ọzọ malitere ịpụta otu mgbe ya na nke Bekee.

Mbipụta nke a nke Ụlọ Nche na-aka afọ nke iri nke ibipụtakọ ha ọnụ akara. A na-ebipụta Ụlọ Nche ugbu a na 116 asụsụ, 85 n’ime ha na-abịakọ ọnụ. Nke a pụtara na 99.3 pasent nke ngụkọta nkezi nke mbipụta bụ́ 16,100,000 mkpụrụ Ụlọ Nche ka a na-ebipụta n’otu ụdị ihu akwụkwọ na isiokwu dị iche iche. N’ime ndị na-eje Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche kwa izu, ihe karịrị 95 pasent na-atụle otu isiokwu ahụ n’otu mgbe ahụ.

Teta!, magazin nke ya na Ụlọ Nche na-agakọ, na-apụtakọ ọnụ na 37 asụsụ n’ime 74 asụsụ a na-ebipụta ya. A na-ebipụta akwụkwọ Yearbook of Jehovah’s Witnesses nke a na-ebipụta kwa afọ na asụsụ 18. Ụdị ibipụtakọ akwụkwọ ọnụ dị otú ahụ na-enye aka ijikọ ndị Chineke “n’otu uche ahụ na n’otu izu ahụ.”​—⁠1 Ndị Kọrint 1:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya