Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 4/15 p. 30
  • Ị̀ Na-echeta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-echeta?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • William Whiston—Onye Mmụta Jụrụ Okwukwe ka ọ bụ nke Nwere Obi Eziokwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Mkpụrụ—nke Ọma na nke Ọjọọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ozizi Assumption Ọ Bụ Nkwenkwe nke Chineke Kpughere?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Izi Ihe Chineke Na-enwe Mmeri
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 4/15 p. 30

Ị̀ Na-echeta?

Ì nwewo ọṅụ n’ịgụ mbipụta ndị ọhụrụ nke Ụlọ Nche? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-amasị gị icheta ihe ndị na-esonụ:

▫ N’ihi gịnị ka ndị nledo ndị Israel ji họrọ ịnọdụ n’ụlọ Rehab bụ́ nwanyị akwụna?

Ndị nledo ndị Israel ahụ ji Iwu Chineke ebi ndụ, ya mere ha anọdụghị n’ụlọ Rehab maka omume rụrụ arụ. Ma eleghị anya ha chere na ọnụnọ ha n’ụlọ onye akwụna agaghị akpalicha ịbụ ndị a na-enyo enyo n’ime obodo ahụ. Na e wuru ya ná mgbidi nke obodo ahụ pụrụ ime ka mgbapụ dị mfe karị. Ma karịsịa ihe nile, Jehova duuru ha gaa na nke onye mmehie akụkọ dị iche iche nke mmeso Chineke n’ebe ndị Israel nọ metụrụ n’obi ya n’ụzọ dị mma nke na o chegharịrị ma gbanwee ụzọ ya nile.​—⁠12/15, peji nke 24-⁠25.

▫ Olee otú iwe si emetụta ahụ ike anyị?

Ihe ọmụmụ dị iche iche na-egosi na iwe na-ewepụta mmiri ọgwụ dị iche iche nke nrụgide. Ntiwapụ mgbe mgbe nke iwe pụrụ ịkpalite enweghị nhazi n’etiti ụdị ndị na-echebe echebe na ndị na-emerụ ahụ nke cholesterol, na-etinye anyị n’ihe ize ndụ nke ọrịa obi.​—⁠12/15, peji nke 32.

▫ Aro ndị dị aṅaa ga-enyere anyị aka iwelite ọnụ ọgụgụ Ụlọ Nche na Teta! anyị na-ekesa?

Na-eburu Ụlọ Nche na Teta! n’obi; mee ka ụzọ iche ya n’ihu mmadụ dị mfe; na-eme mgbanwe site n’ịkwadebe ụzọ ole na ole dị mkpirikpi isi chee ya n’ihu mmadụ; setịpụ ihe mgbaru ọsọ onwe onye.​—⁠1/1, peji nke 24-⁠25.

▫ N’ihi gịnị ka Mosis ji bụrụ nnọọ ihe atụ ọma nke ọchịchị Chineke anyị ga-agbaso?

Mosis chọrọ nduzi Jehova n’okwu. O nweghị oké ọchịchọ ndị nke onwe ya kama o nwere nchegbu maka ebube Jehova. O nwere okwukwe siri ike, ọ dịghịkwa mgbe o chezọrọ na Jehova bụ Onye Ọchịchị bụ ezie nke mba Israel.​—⁠1/15, peji nke 11.

▫ Olee ụzọ ụfọdụ izi ihe Chineke si na-enwe mmeri?

Izi ihe Chineke na-enwe mmeri site n’inye ndị Jehova nghọta na-aga n’ihu n’ihu nke eziokwu ahụ. Ọ na-ewebata ndị mmadụ n’ìhè ime mmụọ, ọ na-egosikwa ndị dị obi umeala ụzọ isi fee Chineke “n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24) Izi ihe Chineke na-emerikwa ọnwụnwa dị iche iche na ụwa ọjọọ.​—⁠2/1, peji nke 10-⁠12.

▫ Gịnị bụ ụzọ isi nwee ihe ịga nke ọma n’inye ndụmọdụ?

Ụzọ ya bụ ezi nkwanye ùgwù maka onye nke ọzọ ahụ na iru eru ya ịbụ onye e mesoro n’ụzọ dị ùgwù. Ya mere, onye Kraịst na-enye ndụmọdụ kwesịrị ịdị obi ọma ma na-eguzosi ike n’ihe, ma o kwesịrị iyikwasị onye na-anara ya ùgwù dị ka uwe.​—⁠2/1, peji nke 28.

▫ Olee otú Chọọchị Roman Katọlik si nakwere Assumption Meri dị ka ozizi?

Na narị afọ ndị mbụ mgbe Jisọs nwụsịrị, echiche nke Assumption Meri gaa n’eluigwe bụ ihe na-abataghị ma ọlị n’echiche ndị Kraịst. Otú ọ dị, mgbe a nabatara nkụzi Atọ n’Ime Otu dị ka ozizi chọọchị, e nyere Meri ọnọdụ nọgidere na-adịwanye mkpa. A nakwereghị echiche Assumption dị ka ozizi na-enweghị mgbagha ruo na November 1, 1950, mgbe Pope Pius nke Iri na Abụọ mara ọkwa, sị: “Anyị na-akọwa ya ịbụ nkwenkwe nke Chineke kpughere.”​—⁠Munificentissimus Deus.​—⁠2/15, peji nke 26-⁠27.

▫ Na Jeremaịa isi 24, gịnị ka nkata fig abụọ ahụ, fig ọma na ndị nke ahụ dị njọ, nọchitere anya ha?

Fig ọma ndị ahụ nọchitere anya ndị Juu e bu ụzọ dọrọ laa n’agha gaa Babilọn, ebe ihe fọdụrụnụ ga-esi laghachi Juda. Fig ndị ọjọọ nọchitere anya Eze Zedekaịa na ndị nọnyeere ya bụ́ ndị nupụrụ isi megide Eze Nebukadneza n’agbanyeghị na ha aṅụwo iyi n’aha Chineke. N’ụzọ iji ihe tụnyere ihe, anyị na-achọta n’oge ndị a ihe fọdụrụ n’Isreal ime mmụọ, bụ́ ndị mịpụtaworo mkpụrụ ọma ná ndụ ha, n’ụzọ na-adịghị ka ndị ụkọchukwu Krisendọm, bụ́ ndị mịpụtaworo mkpụrụ rere ure.​—⁠3/1, peji nke 14-⁠16.

▫ Olee ndị bụ ndị Quartodeciman, gịnịkwa ka ha ji na-adọrọ mmasị ndị Kraịst taa?

Mgbe oge ndị ozi gasịrị, e nwere ụfọdụ ndị mere ememe Nri Anyasị Onyenwe Anyị na Nisan 14 kwa afọ, na-agbaso usoro ndị ozi ahụ. A biara mara ha dị ka “Ndị Ụbọchị nke Iri na Anọ,” ma ọ bụ ndị Quartodeciman. Nke a na-adọrọ mmasị taa, n’ihi na ọ na-egosi na ọbụna mgbe ndị ozi ahụ nwụsịrị, e nwere ụfọdụ ndị nọgidesiri ike n’usoro ziri ezi nke ime ncheta ọnwụ Jisọs otu ugbo n’afọ na Nisan 14.​—⁠3/15, peji nke 4-⁠5.

▫ Ònye bụ́ William Whiston?

Ọ bụ onye mmụta maara akwụkwọ na narị afọ nke 18 n’England, onye ya na Sir Isaac Newton kpachiri anya. Whiston sụgharịrị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, megide nkụzi ozizi Atọ n’Ime Otu n’ụzọ pụtara ìhè, ọ bụkwa onye nkụzi ná mmụta nnyocha mbara igwe na mgbakọ na mwepụ. Ma o yikarịrị ka a na-echeta Whiston maka nsụgharị ya gaa na Bekee nke ihe ndị onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Flavius Josephus dere.​—⁠3/15, peji nke 26-⁠28.

▫ Olee otú e si mee mmadụ n’oyiyi Chineke? (Jenesis 1:27)

E tinyere n’ime mmadụ ikike nke igosipụta àgwà ndị pụtara ìhè nke Chineke, bụ́ ịhụnanya, ikpe ziri ezi, amamihe, na ike​—⁠nakwa àgwà ndị ọzọ.​—⁠4/1, peji nke 25.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya