Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 5/15 p. 3
  • Ị̀ Na-ewere Bible n’Ihe Bara Uru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-ewere Bible n’Ihe Bara Uru?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • “Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta ná Ndụ Meri
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • O Diri Ọnwụ Nwa Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 5/15 p. 3

Ị̀ Na-ewere Bible n’Ihe Bara Uru?

NANỊ ihe karịrị 200 afọ gara aga, a mụrụ Mary Jones na Llanfihangel, obodo nta dịpụrụ adịpụ na Wales nke na-adịghị anya site n’ụsọ osimiri Atlantic. Ndị mụrụ ya bụ ndị ogbenye na-akpa nkata​—⁠ndị dara ogbenye nke na ha apụghị inwe Bible. Ma ha kụbanyere n’ime nwa ha nwanyị ịhụnanya maka Chineke site n’ịkọrọ ya akụkọ dị iche iche nke Bible na ịgụghachi akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ha chetara. Ọtụtụ mgbe Mary na-agụ Bible Welsh nke otu onye agbata obi ha ma malite idoko ego ntakịrị ọ pụrụ inweta, kpebisie ike ịzụta otu nke ya.

N’afọ 1800, mgbe Mary dị afọ 16, ọ nụrụ na a na-ere ụfọdụ Bible Welsh n’obodo nta bụ́ Bala nke dị anya 40 kilomita. N’enweghị nkụda obi, o kpebisiri ike iji ụkwụ gaa ebe ahụ. Nke a ka o mere, gbara ụkwụ nkịtị rịfee ugwu ndị ahụ. Otú ọ dị, mgbe ọ na-erute, e resịwo Bible nile ahụ. Mary chọpụtakwara na ngụkọta ego o dokoworo dị nta nke ukwuu ịzụta ya.

Ihe ọmụma na ịhụnanya Mary nwere na Bible metụrụ pastọ nọ n’ebe ahụ nke ukwuu n’obi. N’ịhụ anya mmiri ya nke enwetaghi ihe a tụrụ anya ya ná mgbalị a dum o tinyere, o ji obi ebere nye ya Bible nke ya, na-asị: “Jiri nlezianya gụọ ya, jiri ịdị uchu mụọ ya, chebe okwu ndị ahụ dị nsọ n’uche gị, meekwa ihe kwekọrọ ná nkụzi ya nile.”

E mesịrị kọọ akụkọ a n’otu nzukọ nke Committee of the Religious Tract Society of London. N’ebe ahụ e mere mkpebi ibuga nsụgharị dị iche iche nke Bible ọ bụghị gakwuru nanị ndị Wales kama gaa n’ụwa nile. Site ná mmalite a dị nta ka nke mbụ n’ime ọtụtụ òtù Bible na narị afọ nke 19 si malite. Mgbe nke ahụ gasịrị, Bible ndị dị n’asụsụ ofesi dị iche iche malitere ịpụta n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-arị elu.

Taa, Watch Tower Bible and Tract Society, nke e hiwere na 1884, na-ebi Bible na ihe enyemaka dị iche iche iji mụọ Bible n’ihe karịrị 200 asụsụ. Gburugburu ụwa, o kesawo 72 nde nke New World Translation of the Holy Scriptures dị n’asụsụ ọgbara ọhụrụ. Dị ka nke a sụgharịtara site na Hibru na Grik mbụ, e nwere New World Translation ugbu a n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ụfọdụ n’asụsụ 18, a na-asụgharịkwa ya ugbu a n’asụsụ 12 ọzọ.

Ebe Bible pụrụ iru ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile aka ugbu a, olee otú i si ele ya anya? Ị̀ na-ewere Bible n’ihe bara uru? Ì nwere nke gị i weere n’ihe dị oké ọnụ ahịa ma na-agụ ya?

[Ebe e si nweta foto dị na peeji 3]

Site n’akwụkwọ bụ́ The Story of Mary Jones and Her Bible

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya