Ememe Ncheta Ọmụmụ Ahapụwo Akụkọ nke Ọnwụ
IHE ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ na-ewere ememe ncheta ọmụmụ dị ka nanị omenala dị ọcha. Ma Bible adịghị enye echiche dị mma banyere ọdịnala nke a. Otu ihe bụ na Akwụkwọ Nsọ enweghị ihe ngosi ọ bụla nke na onye ọ bụla n’ime ndị ji ikwesị ntụkwasị obi jeere Chineke ozi mere ememe ncheta ọmụmụ.
Nanị ememe ncheta ọmụmụ abụọ Bible kpọtụrụ aha bụ maka ndị na-achị isi ndị bụ ndị iro nke Chineke. Ememe nke ọ bụla gụnyere ogbugbu mmadụ, ka ndị a kpọrọ oriri wee nwee ọṅụ arụrụala n’ihi ọnwụ nke onye kpasuru eze iwe. N’ọnọdụ nke mbụ, Fero, eze Ijipt, gburu onye isi ndị osi ite ya. (Jenesis 40:2, 3, 20, 22) Onye ọchịchị Ijipt ahụ mere otú ahụ n’oge oriri ahụ n’ihi na iwe ejidewo ya n’ebe onye na-ejere ya ozi nọ. N’oge nke abụọ, Herọd, onye ọchịchị ahụ na-eme omume rụrụ arụ nke Galili, bepụrụ isi Jọn Onye Na-eme Baptism dị ka ihe ọma o meere nwa agbọghọ nke egwú ọ gbara ná nnọkọ oriri ahụ tọrọ ya ụtọ. Lee aha ihe ịsọ oyi nke ahụ bụ!—Matiu 14:6-11.
Ma ọ̀ bụ na Bible elekwasịbeghị anya n’ememe ncheta ọmụmụ abụọ pụrụ nnọọ iche? Ọ bụchaghị otú ahụ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme ndị Juu n’oge ochie bụ́ Josephus na-ekpughe na ihe ndị a merenụ apụghị iche. O dekọrọ oge ndị ọzọ nke ogbugbu mmadụ n’ememe ncheta ọmụmụ maka ime ihe ntụrụndụ.
Dị ka ihe atụ, ụfọdụ weere ọnọdụ mgbe mbibi Jerusalem n’afọ 70 O.A. gasịrị, mgbe 1,000,000 ndị Juu lara n’iyi, 97,000 lanarịkwa ma bụrụ ndị a tụrụ mkpọrọ. Ka ha na-aga Rom, ọchịagha ndị Rom bụ́ Titus duuru ndị Juu o jidere gaa n’ọdụ ụgbọ mmiri dị nso nke Sizaria.
Josephus na-ede: “Ka Titus nọgidere na Sizaria, o ji oké ememe mee ncheta ọmụmụ nke nwanne ya nwoke bụ́ Domitian, na-eme ka ihe karịrị 2,500 ndị mkpọrọ nwụọ n’egwuregwu nke ha na anụ ọhịa dị iche iche na n’ọkụ. Mgbe nke a gasịrị ọ gara Berytus [Beirut], ógbè Rom na-achị na Finisia, ebe o mere ememe ncheta ọmụmụ nna ya site n’igbu ọtụtụ ndị ọzọ e ji eji karị n’oké ememe okomoko.”—The Jewish War, VII, 37, nke Paul L. Maier sụgharịrị n’akwụkwọ bụ́ Josephus: The Essential Writings.
Ọ bụghị ihe ijuanya na akwụkwọ The Imperial Bible-Dictionary na-asị: “Ndị Hibru n’oge ndị sochirinụ lere ememe ncheta ọmụmụ nile anya dị ka akụkụ nke ofufe arụsị, echiche nke a ga-emesi ike nke ukwuu site n’ihe ha hụrụ n’ihe ndị a na-emekarị bụ́ ndị e jikọrọ ha na ụbọchị ndị a.”
Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi na narị afọ mbụ agaghị enwewo mmetụta nke isonye n’omenala nke a kọrọ n’ụzọ na-adịghị agba ume ma ọlị otú a n’ime Bible na nke ndị Rom na-eme n’ụzọ na-asọ oyi otú a. Taa, ezi ndị Kraịst matara na ihe ndekọ Bible banyere ememe ncheta so n’ihe ndị e dere maka izi ha ihe. (Ndị Rom 15:4) Ha na-ezere ime ememe ncheta n’ihi na ememe ndị dị otú ahụ na-eme ka ọ dị ka onye ahụ ọ̀ dị mkpa gabiga otú o kwesịrị. Nke kakwa mkpa, ndị na-ejere Jehova ozi ji amamihe na-eburu n’uche akụkọ ọjọọ a kọrọ banyere ememe ncheta ọmụmụ n’ime Bible.
[Foto dị na peeji nke 25]
Ọgbọ egwuregwu na Sizaria