Ihe Odide Ndị Nwere Ihe Pụrụ Iche Ha Pụtara
“IEHOVA SIT TIBI CUSTOS”
OKWU ndị a e dekwasịrị n’ihu ahụ ájá nke ụlọ narị afọ nke 17 na Celerina, ebe ọwụwa anyanwụ Switzerland, pụtara “Jehova bụrụ onye nchebe gị.” N’ebe ugwu nke a, a na-ahụkarị aha Chineke ka e dekwasịrị ma ọ bụ bie ya n’ụlọ, chọọchị, na ụlọ obibi ndị ụkọchukwu dịworo ọtụtụ narị afọ. Olee otú e si mara aha ahụ bụ́ Jehova nke ọma otú a?
Rhaetia oge ochie (nke jikọtara akụkụ ụfọdụ nke ebe ndị bụ ugbu a ndịda ọwụwa anyanwụ Germany, Austria, ebe ọwụwa anyanwụ Switzerland) ghọrọ ógbè ndị Rom na 15 T.O.A. Ndị bi n’ebe ahụ malitere ịsụ Romansh, asụsụ dabeere n’asụsụ Latin nke a malitere ịsụ n’olu dị iche iche ndị a ka na-asụ n’ụfọdụ ndagwurugwu Alpine nke Switzerland na n’ebe ugwu Itali.
Ka oge na-aga, a sụgharịrị akụkụ ụfọdụ nke Bible gaa na Romansh. Otu mbipụta, Biblia Pitschna, nwere Abụ Ọma na Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Na Bible nke a, nke e bipụtara na 1666, aha ahụ bụ́ Iehova pụtara ọtụtụ mgbe n’ime Abụ Ọma dum. Ebe Bible bụ akwụkwọ ọgụgụ bụ́ isi n’ebe obibi, ndị na-agụ Biblia Pitschna matara aha Onye Okike ahụ nke ọma.
Otú ọ dị, ọgbọ ndị na-esotenụ enwekwaghị mmasị n’ihe banyere Bible. Ọtụtụ agbalịghị ịmata ihe okwu ahụ bụ́ “Iehova” pụtara, ndị ụkọchukwu emekwaghị mgbalị ọ bụla ịkọwa ya. Ya mere, ihe ndekwasị ndị ahụ ghọrọ nanị ihe ịchọ mma e ji mara ọgbọ gara aga.
N’ime iri afọ ndị na-adịbeghị anya, izighachi ozizi anọwo na-ewere ọnọdụ. Ndịàmà Jehova esiwo n’ala ndị dị laarị bịa, na-enwe oge ezumike ná ndagwurugwu mara mma ndị a ma na-eme ya isi ihe dị mkpa izi ndị bi n’ebe ahụ ihe banyere Chineke onye aha ya bụ Jehova. Ụfọdụ Ndịàmà ebiriwo n’ebe ahụ ka ha wee tinye oge ka ukwuu n’ịgwa ndị mmadụ maka nzube nile dị ebube nke Onye Okike maka ụwa na mmadụ. Otú a, ihe ndekwasị ochie ndị dị n’asụsụ Romansh na-enwe nghọta ọhụrụ ka ndị mmadụ na-amụ banyere ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova.
[Foto ndị dị na peeji nke 32]
IEHOVA PORTIO MEA: Jehova bụ òkè m.—Lee Abụ Ọma 119:57