“Mkpọrọgwụ Ndị A Na-apụghị Ifopụ Efopụ”
N’IME ihe ndị dị ndụ kasị ibu ma kasị mee ochie n’ụwa bụ osisi sequoia nke California. Osisi ndị a ogologo ha na-atụ n’anya na-eru ihe dị ka 90 mita n’ịdị elu mgbe o tozuru ókè, nweekwa ike ịdị ndụ ruo 3,000 afọ.
Ọ bụ ezie na sequoia dị egwu n’ile anya, usoro mkpọrọgwụ ya a na-adịghị ahụ anya na-adọrọkwa adọrọ. Sequoia nwere ụba mkpọrọgwụ gbasara ka ute dị larịị nke pụrụ ikpuchite mbara ala buru ibu dị ka 1.2 ruo 1.6 hekta. Usoro mkpọrọgwụ a buru ibu na-enye ihe njigide siri ike n’oge idei mmiri na oké ifufe. Ọbụna ọ bụ ihe pụrụ ikwe mee sequoia iguzogide ala ọma jijiji dị ike!
Eze Solomọn họọrọ usoro mkpọrọgwụ siri ike nke otu osisi dị ka okwu myirịta n’ime otu ilu ya. “Ọ dịghị onye pụrụ iguzobe onwe ya site ná mmebi iwu,” ka ọ sịrị, “ma ndị ezi omume nwere mkpọrọgwụ ndị a na-apụghị ifopụ efopụ.” (Ilu 12:3, The New English Bible) Ee, ndị na-emebi iwu na-ama jijiji n’ala. Ihe ịga nke ọma ọ bụla o yiri ka ha na-enwe bụ nanị ruo nwa oge, n’ihi na Jehova na-ekwe nkwa na “olileanya ndị na-emebi iwu ga-ala n’iyi.”—Ilu 10:28.
Nke a bụ ihe ịdọ aka ná ntị nye ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst, n’ihi na Jisọs sịrị na ụfọdụ agaghị ‘enwe mkpọrọgwụ’ n’ime onwe ha ma bụrụ ndị ga-asụ ngọngọ. (Matiu 13:21) Ọzọkwa, Pọl onyeozi dere banyere ndị ga-abụ “ndị ifufe nile ọ bụla nke ozizi [ụgha] na-efegharị na-ebugharịkwa.” (Ndị Efesọs 4:14) Olee otú a pụrụ isi gbochie nke a?
Dị nnọọ ka mkpọrọgwụ sequoia si agbasawanye nke ukwuu n’ime ala na-eme nri, otú a ka ọ dị uche na obi anyị mkpa ịmịba n’ụzọ miri emi n’ime Okwu Chineke ma na-adọpụta mmiri ya na-enye ndụ. Nke a ga-enyere anyị aka ịzụlite okwukwe gbasiri mkpọrọgwụ ike. N’ezie, anyị ga-enwe mmetụta nke ihe ndị si n’ule ndị tara akpụ pụta. Anyị pụrụ ọbụna ịma jijiji, dị ka osisi, n’ihu ihe isi ike. Ma ọ bụrụ na okwukwe anyị bụ nke e wusiri ike, anyị ga-aghọ ndị nwere “mkpọrọgwụ ndị a na-apụghị ifopụ efopụ.”—Tụlee Ndị Hibru 6:19.