Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 12/15 p. 32
  • “Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 12/15 p. 32

“Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile”

N’IME akụkọ ihe mere eme nile, ndị ohu Chineke ndị kwesịrị ntụkwasị obi agabigawo oge nhụjuanya nke mmetụta uche ndị siri ike. Lee ka nke a si bụrụ eziokwu karị taa, ebe ọ bụ na anyị na-ebi ‘n’oge dị oké egwu’! (2 Timoti 3:1) Pọl onyeozi nyere ndị Kraịst ndụmọdụ ịtụkwasị Jehova nchegbu ha nile site n’ekpere. Gịnị ga-esi na ya pụta? “Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.”​—⁠Ndị Filipaị 4:7.

Gịnị bụ “udo nke Chineke” nke a? Ọ bụ ịdị jụụ nke na-abịa site n’isoro Onye Okike nwee mmekọrịta chiri anya. Ịdị nso dị otú ahụ na-enye anyị obi ike na n’agbanyeghị nhụjuanya anyị dị iche iche, Jehova “agaghị agbahapụ ndị ya; ọ gaghị ahapụ ndị dịnyeere ya kpam kpam.”​—⁠Abụ Ọma 94:14, Today’s English Version.

Nke a apụtaghị na a na-echebe anyị pụọ n’ihe isi ike. “Ha dị ọtụtụ, bụ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume,” ka onye ọbụ abụ ahụ dere. (Abụ Ọma 34:19) Ma udo nke Chineke pụrụ iweta ahụ efe. N’ụzọ dị aṅaa?

Udo nke Chineke “kachasị uche nile,” ka Pọl dere​—⁠ma ọ bụ dị ka e dere ná nsụgharị Concordant Version, ọ “karịrị ọnọdụ uche ọ bụla.” Nchegbu pụrụ ime ka anyị nwee mmetụta uche dịgasị iche iche ndị na-adịghị mma. (Eklisiastis 7:7) Ma, udo nke Chineke pụrụ ime ka anyị kwụrụ chịm, karịsịa mgbe “ọkịka nke ike” dị anyị mkpa.​—⁠2 Ndị Kọrint 4:7; 2 Timoti 1:7.

Ọzọkwa, udo nke Chineke bụ ihe nchebe. Ọ pụrụ ‘iche obi na echiche uche unu nche,’ dị ka Pọl degaara ndị Filipaị n’akwụkwọ. Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “cheekwa” bụ asụsụ ndị agha ji eme ihe nke yikarịrị ka ọ na-akpalite onyinyo echiche nke ndị nche ndị na-anọ na nche ehihie na abalị. N’otu ụzọ ahụ, udo nke Chineke pụrụ ịrụ ọrụ dị ka onye na-eche obi anyị na echiche uche anyị nche 24 hour.​—⁠1 Ndị Kọrint 10:13; tụlee Ndị Efesọs 4:26.

N’ịtụle ihe ịma aka ndị siri ike anyị na-eche ihu taa, ọ̀ bụ na udo nke Chineke abụghị ihe anyị ga-enwe ekele maka ya?​—⁠Abụ Ọma 18:2; tụlee Ọpụpụ 40:38.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya