“Ahụtụbeghị M Ihe Dị Otú A!”
NA 1993 a kpọrọ ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Argentina òkù iziga otu puku mmadụ na Santiago, Chile, maka Mgbakọ Distrikti “Izi Ihe Chineke” nke Ndịàmà Jehova nke ga-ewe ụbọchị anọ. Nke a bụ nke mbụ a kpọworo Ndịàmà bụ́ ndị Argentina òkù ije mgbakọ n’ala ọzọ dị ka otu ìgwè buru ibu. Olee otú ha si zaghachi? E nwetara ihe gafere 8,500 ndị denyere aha ha, nke e si na ha họrọ 1,039 ndị ga-ejenụ.
A gbazitere ngụkọta nke bọs 14 iji mee njem a dị 1,400 kilomita site na Buenos Aires ruo Santiago. Gburugburu ndị mara mma mere ka njem ahụ were 26 hour tọọ ụtọ karị. N’ịgafere Ugwu Andes nile, ndị ahụ na-aga mgbakọ gafeere n’ebe dịdewere Aconcagua, n’ịdị elu nke 6,960 mita, ugwu nke kachasị elu n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Ihe a na-echeta karịsịa bụ mkpọda ahụ, ụzọ nrịda ahụ gbagọrọ agbagọ banye Chile. A kụọrọ ndị na-akwọ ụgbọ ala ndị ahụ aka nke ukwuu n’ihi nkà ha ji mee ihe n’imeri mkpọda ndị ahụ siri ike!
Otú ọ dị, ihe kasị mma a hụrụ bụ ná mgbakọ ahụ n’onwe ya. N’ime ụwa nke jupụtara n’ọgba aghara obodo na esemokwu agbụrụ, lee ka o si bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ ịhụ 80,000 ìgwè mmadụ dị n’otu ndị sitere na 24 mba so bịa—n’ezie òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ! Ebe ha jiworo anya ha hụ ịdị n’otu nke dị n’etiti ndị ahụ bịara mgbakọ, ụfọdụ n’ime ndị ahụ kwọrọ ụgbọ ala bọs ndị ahụ kwupụtara mmasị ha nwere n’ịmụtakwu banyere Ndịàmà Jehova. “Ahụtụbeghị m ihe dị otú a!” ka otu n’ime ha tipụrụ ná mkpu.