Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 11/1 p. 2-4
  • È Nwere Ndị Mmụọ Ozi n’Etiti Anyị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • È Nwere Ndị Mmụọ Ozi n’Etiti Anyị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Inwe Oké Mmasị n’Ebe Ndị Mmụọ Ozi Nọ
    Teta!—1999
  • Ịnwale Akụkọ Ndị Ahụ
    Teta!—1999
  • Otú Ndị Mmụọ Ozi Pụrụ Isi Nyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ì Nwere Mmụọ Ozi Na-eche Gị Nche?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 11/1 p. 2-4

È Nwere Ndị Mmụọ Ozi n’Etiti Anyị?

O mere nnọọ ngwa ngwa. N’ịbụ onye mikpuru n’echiche ma ghara ịma ihe na-eme gburugburu ya, Marilynn banyere n’ụzọ ụgbọ okporo ígwè. Na mberede, ọ nụrụ mkpọtụ na-ada ụda. O leliri anya, ma chọpụta na ya guzo kpọmkwem n’ihu ụzọ nke ụgbọ okporo ígwè na-abịanụ! Marilynn kpọnwụrụ, ahụ akụnwụọ ya n’egwu. Ụgbọ okporo ígwè ahụ abịawo ya nso nke na ọ pụrụ ịhụ mkpụrụ anya na-acha anụnụ anụnụ na ihu ụjọ nke onye na-anya ụgbọ ahụ. Marilynn agaghị echefu ma ọlị ihe mezirinụ. “O yiri ka otu dimkpa si n’azụ kwaa m aka,” ka o kwuru. “M si n’ụzọ okporo ígwè ahụ fepụ ma dakwasị n’unyi dị n’ala.” N’ịbụ onye merụrụ ntakịrị ahụ, Marilynn bilitere ikele onye napụtara ya—ma ọ dịghị onye ọ hụrụ! Gịnị bụ nkwubi okwu ya? “Mmụọ ozi na-eche m nche zọpụtara ndụ m,” ka Marilynn na-asị. “Ònyekwanụ ka ọ pụrụ ịbụwo?”

ỤWA nke na-arụ ụka yiri ihe ara mmụọ ozi na-agba na mberede. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ihe e kere eke ndị nọ n’eluigwe abụrụwo isiokwu nke ihe ngosi dị iche iche nke telivishọn, sinima, na ọbụna otu ihe nkiri a na-eme na Broadway. Akwụkwọ dị iche iche e dere banyere ndị mmụọ ozi nọ n’isi nke akwụkwọ okpukpe ndị a kasị erepụ. E nwere òtù, nzukọ, na akwụkwọ akụkọ banyere ndị mmụọ ozi. E guzobewo ebe ọzụzụ dị iche iche inyere gị aka—dị ka otu isiokwu si tinye ya—iji wepụta “‘mmụọ ozi ime’ gị.”

Ndị ahịa ndabara ndị na-akpọsa ọnụ ọgụgụ na-adịghị agwụ agwụ nke ngwá ahịa na-eji okwu banyere ndị mmụọ ozi eme ihe n’ụzọ na-adịrị ha mma. “Ihe ọ bụla ndị mmụọ ozi dị n’elu ya bụ ihe na-aga ahịa,” ka otu onye so nwere ụlọ ahịa na United States na-ekwu. Tinyere ọtụtụ akwụkwọ, o depụtara “ihe ọkpụkpụ, agịga, ụmụ bebi, uwe T-shirt, ihe nnyapawa na kaadị ekele ndị nke mmụọ ozi”—ha nile na-eweta ihe otu onye nta akụkọ kpọrọ “uru si n’eluigwe.”

Ma nke a abụghị nanị ihe na-ewu ewu, ka ndị na-akwado mmụọ ozi nọgidere na-ekwu. Iji kwadoo nzọrọ ha, ha na-egosi ọtụtụ ihe akaebe—“ahụmahụ mere ná ndụ” nke izute ndị mmụọ ozi. Ụfọdụ na-asị na ha hụrụ mmụọ ozi n’ụdị mmadụ. Ndị ọzọ hụrụ ìhè, nụ olu, nwee mmetụta nke ihe ịnọ ha nso, ma ọ bụ nwee mkpali nke ha kwere na ọ bụ nke mmụọ ozi. Ọtụtụ, dị ka Marilynn, na-ekwu na otu mmụọ ozi zọpụtara ndụ ha.

Gịnị na-eme? “Echere m na e nwere mpụtaghachi nke iji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe,” ka Joan Wester Anderson na-ekwu, bụ́ onye deworo akwụkwọ abụọ banyere izute “ikike ka nke mmadụ.” Alma Daniel, onye nyere aka ide akwụkwọ ọzọ, weere ya gakwuo n’ihu. Ọ na-asị na ndị mmụọ ozi bụ ndị “a na-atụziri ugbu a ime ka a mara ha ka e wee nwee ike irute ọtụtụ mmadụ karị. Ihe mere anyị ji ahụ ọtụtụ ihe banyere ha bụ n’ihi na ha chọrọ ya otú ahụ. Ha na-eme ya.”

Ọ̀ bụ otú a ka ọ dị n’ezie? Ka ọ̀ dị ihe ọzọ na-akpata mmasị a a na-enwe ugbu a n’ebe ndị mmụọ ozi nọ? Iji chọpụta, anyị aghaghị inyocha Okwu Chineke. Bible nwere eziokwu banyere ndị mmụọ ozi, dị ka anyị ga-ahụ.

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]

Peji 3 na 4: The New Testament: A Pictorial Archive from Nineteenth-Century Sources, nke Don Rice/Dover Publications, Inc.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya