Mmeri n’Okwu Ikpe
N’APRIL nke 1995, e nwere mmeri ụlọikpe dị ịrịba àmà. Ihe a nile malitere na January 28, 1992, mgbe e nyere Luz Nereida Acevedo Quiles, onye dị 24 afọ, àkwà n’Ụlọ Ọgwụ El Buen Pastor dị na Puerto Rico maka ịwa ahụ bụ́ nke a họọrọ. Mgbe e nyere ya àkwà, o kwuru ma n’ọnụ ma n’ihe odide na dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ gaghị anakwere mmịnye ọbara. (Ọrụ 15:28, 29) Ndị ọrụ ụlọ ọgwụ nke a metụtara, tinyere onye dọkịta gwọrọ ya, maara ọchịchọ ya nile nke ọma.
Ụbọchị abụọ mgbe ịwa ahụ ya gasịrị, ọbara buru ibu gbafuru Luz n’ahụ, ọ malitewara ịrịa ọrịa ụkọ ọbara dị njọ n’ihi ịgbafu oké ọbara. Onye dọkịta na-agwọ ya, bụ́ Dr. José Rodríguez Rodríguez, chere na nanị ụzọ a ga-esi nyere ya aka bụ inye mmịnye ọbara. Ya mere, n’emeghị ka nwa aghọghọ ahụ mata ma ọ bụ nata ikike ya, o tinyere akwụkwọ maka iwu ụlọikpe iji mịnye Luz ọbara.
Ọ bụ ezie na Luz maara onwe ya n’ụzọ zuru ezu ma nwee ike ịzara ọnụ ya, Dr. Rodríguez Rodríguez gbara isi akwara na n’ihi ịdị ngwa nke ọnọdụ ahụ, oge adịghị ịnata ikike onye ọ bụla. Onye na-ekpechitere ógbè ahụ ikpe, bụ́ Eduardo Pérez Soto, bịanyere aka na fọm ahụ, ọkàikpe ógbè ahụ, bụ́ Honorable Ángel Luis Rodríguez Ramos, nyere iwu ụlọikpe maka mmịnye ọbara ahụ.
N’ihi ya, na January 31, 1992, e bubara Luz n’ọnụ ụlọ a na-awa ahụ, ebe a mịnyere ya ọbara. N’oge mmịnye ọbara ahụ, ọ nụrụ ka ụfọdụ n’ime ndị ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ na-achị ọchị. Ndị ọzọ baara ya mba, na-asị na ihe a na-eme ya bụ maka ọdịmma ya. Ọ lụrụ ọgụ ruo ókè ike kwere ya—ihe nile abụrụ n’efu. Ka ọ na-eru ọgwụgwụ nke ụbọchị ahụ, Luz anatawo unit anọ nke ọbara.
Ọnọdụ Luz abụghị nke mbụ ma ọ bụ nke ikpeazụ metụtara mmịnye ọbara na Ndịàmà Jehova na Puerto Rico. Tupu ahụmahụ ya, ọ dịkarịa nta e nyewo iwu ụlọikpe 15 maka mmịnye ọbara megide ọchịchọ nke ndị meworo okenye bụ́ Ndịàmà Jehova, e nyewokwa ndị ọzọ kemgbe ahụ. N’ụzọ dị mwute, n’otu ọnọdụ e mere ihe iwu ụlọikpe kwuru, a mịnyekwara onye ọrịa ọbara ná mmanye mgbe ọ na-amaghị ihe na-emenụ.
Otú ọ dị, ọgụ Luz akwụsịghị n’ọnụ ụlọ ahụ a na-awa ahụ. N’October 1993 a gbara akwụkwọ n’ụlọikpe megide Mba Puerto Rico. Ụlọikpe Ka Elu nụụrụ okwu ikpe ahụ, n’April 18, 1995 kwa, e ruru mkpebi ikpe nke laara ya. Ụlọikpe ahụ kwuru na iwu ahụ e nyere ịmịnye ọbara “enweghị nkwado ụkpụrụ iwu ma na-anapụ onye ahụ gbara akwụkwọ n’ụlọikpe ikike o nwere ikpe okpukpe masịrị ya, ihe dịịrị nanị onwe onye na ikpebiri onwe ya ihe metụtara ahụ ya n’agbasoghị usoro iwu.”
Mkpebi ikpe a dị ịrịba àmà, n’ihi na ọ bụ nke mbụ ya ụlọikpe dị na Puerto Rico kpelaara Ndịàmà Jehova ikpe n’okwu metụtara mmịnye ọbara. Mkpebi ikpe ahụ kpaliri mmeghachi omume dị ukwuu. E nwere nnọkọ ndị mgbasa ozi, na-enwe ndị nta akụkọ nke akwụkwọ akụkọ, redio, na telivishọn ndị bụ isi bịaranụ.
N’otu abalị ahụ otu ihe omume redio gbasara otu ajụjụ ọnụ a gbara otu n’ime ndị ọkàiwu Luz. A kpọrọ ndị na-ege ntị òkù ịkpọ na fon ma jụọ ajụjụ. Ọtụtụ ndị dọkịta na ndị ọkàiwu kpọrọ ma kwupụta mmasị ha nwere n’ebe okwu ahụ dị. Otu onye kpọrọnụ kwuru, sị: “Sayensị enwebeghị ike ịnwapụta na mmịnye ọbara ga-azọpụta ndụ, ọ bụkwa ihie ụzọ iche otú ahụ.” O kwukwara, sị: “N’oge na-adịghị anya, a ga-edetu mmịnye ọbara n’akụkọ ihe mere eme dị ka otu n’ime ihie ụzọ na mmehie ihe ndị kasị ukwuu nke nkà ọgwụ nke oge a.”
Otu onye prọfesọ n’ihe banyere iwu bụ́ onye a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu mesịrị kpọọ alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society na fon ma kwupụta afọ ojuju ya dị omimi banyere ihe ọ kpọrọ “ezigbo mmeri.” Ọ gbakwụnyere na mkpebi ikpe nke ụlọikpe ahụ na-akwado ihe ndị ruuru mmadụ n’ụkpụrụ iwu, ọ bụghị nke Ndịàmà Jehova nanị, kama nke ụmụ amaala nile nke Puerto Rico.