Ihe Omume Ị Na-ekwesịghị Ịhapụ
“Ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye” na-esite n’aka Chineke, bụ́ Nna anyị nke eluigwe, abịa. (Jemes 1:17) Onyinye kasị ukwuu nke Chineke nyeworo ihe a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie bụ ndokwa maka ịlaghachi n’ọnọdụ ha site n’Ọkpara ya ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Ọnwụ Jisọs dị ka Onye Mgbapụta anyị na-eme ka ndụ ebighị ebi n’ime elu ala bụ́ paradaịs kwe omume. Na Luk 22:19, e nyere anyị iwu ime ememe ncheta ọnwụ ya.
Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù isoro ha kere òkè n’idebe iwu Jisọs nyere. Ememe a na-eme kwa afọ ga-ewere ọnọdụ mgbe anyanwụ dasịrị n’ụbọchị kwekọrọ na Nisan 14 na kalenda Bible nke e ji ọnwa na-agụ, nke ga-abụ na Tuesday, April 2, 1996. Detuo ụbọchị a ka ị ghara ichezọ ya. Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị pụrụ ịgwa gị kpọmkwem ebe na oge a ga-ezukọ.