Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ike Mgbanwe nke Okwu Chineke
DỊ KA ya onwe ya kwuru, ọ bụburịị “onye na-ekwulu Chineke . . . , bụrụkwa onye nsogbu, na onye na-eme mmadụ ihe ihere.” (1 Timoti 1:13) Ma ọ gbanwere! Mgbanwe nke Pọl onyeozi dị ukwuu nke na o mesịrị nwee ike ikwupụta, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi m, dị ka mụ onwe m bụkwa onye na-eṅomi Kraịst.”—1 Ndị Kọrint 11:1.
Taa, ọtụtụ narị puku ndị ji obi eziokwu na-efe ofufe n’ụwa nile na-eme mgbanwe yiri ndị ahụ. Gịnị na-enyere ha aka ime otú ahụ? Ha na-anara ihe ọmụma nke Okwu Chineke ma na-etinye ya n’ọrụ ná ndụ ha. Ahụmahụ na-esonụ na-eme ka ike mgbanwe nke Okwu Chineke pụta ìhè.
Na Slovenia otu di na nwunye metụworo agadi bi nanị ha ná mpụga otu ime obodo. Onye nke bụ di, Jože, dị ihe dị ka 60 afọ ma nwee nsogbu siri ike nke aṅụrụma. Ma, ọ ka na-elekọta nwunye ya bụ́ Ljudmila, na-arịa ọrịa. Otu ụbọchị, ndị nkwusa Alaeze abụọ bịakwutere Jože. Ọ kpọbatara Ndịàmà ahụ n’ebe obibi ya, ebe ha zutere nwunye ya. Mgbe ha nụrụ ozi Alaeze ahụ, anya mmiri ọṅụ rudara n’ihu Ljudmila. Jože n’onwe ya kwa nwere mmasị n’ihe ọ nụrụ ma jụọ ọtụtụ ajụjụ. Mgbe ha nyefesịrị di na nwunye ahụ ụfọdụ akwụkwọ e ji amụ Bible, Ndịàmà ahụ lara.
Otu ọnwa mgbe e mesịrị Ndịàmà ahụ nwere ike ịlaghachi, ha hụkwara akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala ka ọ dị n’elu table. Mgbe a jụrụ ya ebe o si nweta ya, Jože sịrị: “Ahụrụ m mkpọsa dị n’azụ peji nke otu n’ime magazin ndị ahụ unu hapụụrụ m. Ya mere m degara ọfịs unu dị na Zagreb akwụkwọ ma rịọ inweta akwụkwọ ahụ.” N’ihi mmasị ya, a kpọrọ ya òkù ịbịa Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst nke na-abịa abịa nke a ga-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ịbụ ihe ọṅụ nye Ndịàmà ahụ, ọ bịara!
N’oge na-adịghị anya, a malitere ọmụmụ Bible, e nwekwara ọganihu dị mma. Dị ka ihe atụ, mgbe e gosiri Jože site na Bible na ‘ị gaghị emere onwe gị arụsị a pịrị apị, ma ọ bụ . . . kpọọ isiala nye ha, efekwala ha ofufe,’ ọ chịkọtara ihe oyiyi nile okpukpe ndị dị n’ụlọ ozugbo, gụnyere ihe osise, ma tụfuo ha.—Ọpụpụ 20:4, 5.
E mejuru akpịrị ịkpọ nkụ Jože maka eziokwu ime mmụọ. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute ọ ka nwere akpịrị ịkpọ nkụ ọzọ. Ruo ihe dị ka afọ 18, ọ ṅụwo ihe dị ka lita mmanya asaa kwa ụbọchị. N’ihi nsogbu ịṅụ mmanya ya, o lebaghị anya nke ukwuu n’ọdịdị onwe onye ya. Ma mgbe ọ mụtasịrị echiche Chineke banyere iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, o kpebisiri ike ime mgbanwe.
Ọ gbalịrị iji nwayọọ nwayọọ merie nsogbu ya nke ịṅụ mmanya, na-edekọ ole ọ na-aṅụ n’ụbọchị ọ bụla. N’oge na-adịghị anya, ọ bụkwaghị ohu nke mmanya. Ka ọmụmụ Bible ya na-aga n’ihu, ọ mụtakwara na a chọrọ ka ezi ndị Kraịst jigide ịdị ọcha onwe onye dị mma. Ya mere, o nyere Ndịàmà ahụ ego wee, sị: “Gaanụ zụta ihe ọ bụla a na-eyi eyi dị m mkpa iji dị mma n’anya ná nzukọ ndị Kraịst na n’ozi ubi!” Ndịàmà ahụ laghachiri na-eji uwe ime, sọks, akpụkpọ ụkwụ, efe, suit, taị na akpa.
Mgbe ọ mụsịrị Bible ruo otu afọ, Jože na Ljudmila ruru eru isonyere Ndịàmà n’ọrụ ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ọnwa atọ ka e mesịrị, ha gosiri nrara ha raara onwe ha nye Chineke site na baptism ime mmiri n’otu mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova. N’agbanyeghị ime agadi na ahụ esighị ike, Jože keere òkè mgbe nile n’ikwusa ozi ọma ahụ nakwa mgbe e mesịrị ruo mgbe ọ nwụrụ na May nke 1995, o ji ikwesị ntụkwasị obi jee ozi dị ka ohu na-eje ozi n’ọgbakọ. Mkpụrụ dị mma a mịpụtara ná ndụ nke nwoke a dị umeala n’obi na nwunye ya na-enye ihe àmà nke ike mgbanwe nke Okwu Chineke!