Onye Bụbu Ọkàikpe Arịọ Mgbaghara—Mgbe 45 Afọ Gasịrị
N’IME ụlọikpe dị na Berlin, n’August 1995, onye bụbu ọkàikpe n’Ụlọikpe Kasị Elu kwupụtaara otu onye n’ime Ndịàmà Jehova nchegharị ya maka otu ihe ọjọọ o mere 45 afọ gara aga.
N’October 1950, Ụlọikpe Kasị Elu nke German Democratic Republic (GDR) mara Ndịàmà Jehova itoolu ikpe ịbụ ndị na-emegide ọchịchị na ndị nledo nzuzo. A mara abụọ ikpe ịga mkpọrọ mkpụrụ ọka, asaa ndị ọzọkwa—tinyere Lothar Hörnig dị 22 afọ, onye nke anọ na-azara ọnụ ya site n’aka nri nke foto a—bụ ndị a tụrụ mkpọrọ ruo ogologo oge.
Afọ 40 n’ihu, GDR ghọrọ akụkụ nke Federal Republic of Germany. Kemgbe ahụ ndị ọchịchị enyochawo ụfọdụ ikpe na-ezighị ezi nke e kpere n’ebe bụbu GDR, ha agbalịwokwa ikpe ndị aka ha dị na ya ikpe. Otu n’ime ikpe na-ezighị ezi dị otú ahụ bụ ikpe nke Ụlọikpe Kasị Elu kpere Ndịàmà na 1950.
A. T., onye dị 80 afọ ugbu a, bụ otu n’ime ndị ọkàikpe atọ kpebiri ikpe mgbe e kpere Ndịàmà itoolu ahụ ikpe. N’ịbụ onye e boro ebubo ịtụgharị ikpe ziri ezi, a kpụpụrụ ya n’Ụlọikpe Ógbè dị na Berlin ka ọ kọwaa mkpebi ikpe ya.
N’okwu ọ gwara ụlọikpe ahụ, onye ahụ bụbu ọkàikpe kwetara na ya kwadoro mkpebi ikpe amamikpe 45 afọ gara aga, ọ bụ ezie na ya kwadoro ntaramahụhụ na-esirughị ike otú ahụ. Ma ikpe a emewo ya ka ya cheghachi echiche. N’ihi gịnị? Ndị Nazi kpagburu Ndịàmà Jehova n’oge Agha Ụwa nke Abụọ n’ihi na ha jụrụ ịkwado Hitler. Mgbe agha ahụ gasịrị a kpagbukwara Ndịàmà ọzọ, nke ugbu a site n’aka ndị ọchịchị Kọmụnist. Nke a nyere ọkàikpe ahụ “nsogbu nke ukwuu.”
Lothar Hörnig gwara ụlọikpe ahụ na ya nọrọ afọ ise na ọkara n’ụlọ nga ọ nọ nanị ya, a tọhapụghịkwa ya n’ụlọ mkpọrọ nke Brandenburg ruo 1959. Mgbe ọ nụrụ ihe Hörnig kwuru, onye ahụ bụbu ọkàikpe bewara ákwá. “Ọ na-ewute m nke ukwuu,” ka o ji ákwá kwuo. “Biko gbaghara m.” Hörnig nakweere arịrịọ mgbaghara ahụ.—Tụlee Luk 23:34.
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 32]
Neue Berliner Illustrierte