Ije Nleta n’Ala Nkwa Ahụ
KA E were ya na otu enyi gwara gị na ya azụtaworo gị—dị ka onyinye—otu ụlọ ọhụrụ nke dị na gburugburu ebe mara mma, nke dị jụụ. ‘Ọ̀ dị aṅaa?’ ka ị ga-eche. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-adị gị ọkụ n’obi ịhụ ụlọ a n’onwe gị, ịgagharị n’ime ya ma kirie ọnụ ụlọ nke ọ bụla. E kwuwerị, ebe a bụ ebe obibi ọhụrụ gị!
Na 1473 T.O.A., Jehova nyere mba Israel oge ochie ebe obibi ọhụrụ—Ala Nkwa ahụ, ókèala dị ná nkezi ihe dị ka kilomita 500 site n’ebe ugwu ruo n’ebe ndịda nakwa kilomita 55 n’obosara.a N’ịdị n’ebe a kpọworo Ógbè Na-eme Nri, Ala Nkwa ahụ bụ ebe dị ụtọ ibi, nke jupụtara n’ihe ndị pụrụ iche e ji mara ya.
Ma n’ihi gịnị ka i kwesịrị iji nwee mmasị taa ‘n’ebe obibi’ e nyere onye ọzọ, karịsịa onye biri ndụ eri ogologo oge gara aga? N’ihi na ịmara ala a dị n’akụkọ ihe mere eme pụrụ ime ka ị ghọtakwuo ihe ndekọ Bible. “N’ala ndị a kpọrọ aha ha na Bible,” ka Prọfesọ Yohanan Aharoni nwụworo anwụ dere, “e jikọtara ọdịdị mbara ala na akụkọ ihe mere eme n’ụzọ chiri anya nke na ọ dịghị nke a pụrụ ịghọta n’ezie ma e wepụ ibe ya.” Ọzọkwa, n’uju ya Ala Nkwa ahụ nyere ntakịrị ihe atụ nke ihe Paradaịs n’okpuru Alaeze Chineke ga-apụtara ihe a kpọrọ mmadụ n’ụwa nile n’isi nso!—Aịsaịa 11:9.
N’oge ije ozi ya n’elu ala, Jisọs Kraịst jiri ihe ndị a na-ahụkarị n’Ala Nkwa ahụ mee ihe iji kụzie ihe ndị bara uru. (Matiu 13:24-32; 25:31-46; Luk 13:6-9) Anyị onwe anyị kwa pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu n’ụzọ bara uru site ná ntụle nke akụkụ ụfọdụ nke Palestine oge ochie. Ka anyị gagharịa n’ime ọnụ ụlọ ya ụfọdụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, na-enyocha ihe ụfọdụ pụrụ iche e ji mara ala a bụ ebe obibi nke ndị Chineke ruo ọtụtụ narị afọ. Dị ka anyị ga-ahụ, e nwere ihe dị ukwuu anyị pụrụ ịmụta site n’Ala Nkwa ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ojiji e ji “Ala Nkwa” mee ihe n’isiokwu ndị a bụ n’echiche otú ọ dị n’oge ochie, dị ka e si kwuo ya n’ime Bible, n’etinyeghịkwa aka ná nzọrọ ọgbara ọhụrụ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị/okpukpe n’ógbè ahụ.
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 3]
Garo Nalbandian