“Achụpụla Ha!”
“Ọ BỤRỤ na otu onye n’ime Ndịàmà Jehova, ọbụnadị abụọ, akụọ mgbịrịmgba ụzọ gị, achụpụla ha!” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Corriere della Sera na-adụ ọdụ ya. Akwụkwọ akụkọ ahụ nọ na-ezo aka n’ihe merenụ na Treviso, ebe ugwu Itali, bụ́ ebe otu onye ọchụ nta ego tinyere onwe ya n’ihe ize ndụ nke ịtụfu ihe karịrị otu nde lire (ihe karịrị $600, U.S.) n’ihi ịchụpụ Ndịàmà abụọ bịara ileta ya.
Dị ka akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru, Ndịàmà abụọ ji okwu ndị a kọwaara nwoke ahụ onwe ha: “Taa bụụrụ gị ụbọchị ọma. Anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị nwekwara ihe bara uru anyị ga-enye gị.” Mgbe ha kwuru nke a, onye ọchụ nta ego ahụ na-enweghị omume enyi kwachiri ụzọ, n’enyeghị ha ohere ikwucha ihe ha kpụ n’ọnụ.
Ọ bụrụ na nwoke ahụ ṅararị ntị, ọ gaara achọpụta na Ndịàmà ahụ abịawo n’ebe obibi ya iweghachiri ya obere akpa ego ya, bụ́ nke ha hụrụ n’oche ogologo dị n’otu ogige. Ya mere Ndịàmà ahụ enweghị ihe ọzọ ha ga-eme karịa iwere obere akpa ego na ihe ndị dị ya n’ime gaa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii kasị nso. N’echi ya, ndị uwe ojii wetaghachiiri ya onye nwe ya.
“Ọ bụrụ na onye ọzọ nọ n’ọnọdụ [Ndịàmà] abụọ ahụ na-enweghị ihe ịga nke ọma,” ka Il Gazzettino di Treviso kwuru, “ikekwe ọ gaara . . . edobe nnukwute ihe ahụ dị n’obere akpa ego ahụ. Ma ọ bụghị Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-aghaghị ịkwụwa aka ha ọtọ kpam kpam.”
Gịnị na-akpali Ndịàmà Jehova “ịkwụwa aka ha ọtọ kpam kpam”? Ọ bụ ịhụnanya ha maka Chineke na maka ndị agbata obi, n’ikwekọ n’ozizi Jisọs Kraịst. (Matiu 22:37-39) Nke ahụ bụkwa ihe mere Ndịàmà Jehova na-eji aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ ikwusa ozi ọma banyere “ụwa ọhụrụ” ahụ magburu onwe ya nke Jehova Chineke kwere ná nkwa. Ozi olileanya dị otú ahụ bara uru karịa ihe onwunwe ọ bụla!—2 Pita 3:13.