Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 11/1 p. 32
  • “Anyị Nile So n’Otu Ezinụlọ Ahụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Anyị Nile So n’Otu Ezinụlọ Ahụ”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 11/1 p. 32

“Anyị Nile So n’Otu Ezinụlọ Ahụ”

N’AFỌ ndị na-adịbeghị anya mbunobi okpukpe na ịkpa ókè agbụrụ agbasawo n’ụwa nile. Ndịrịta iche ebo akpakewo igbu mmadụ, mmekpọ ọnụ, na arụrụala ndị ọzọ na-eme ihere. Dị ka akụkọ sitere n’aka Òtù Mba Nile Maka Ihe Ruuru Mmadụ si kwuo, mmebi nke ihe ndị ruuru mmadụ manyere ihe karịrị nde mmadụ 23 n’ụwa nile isi n’ebe obibi ha gbapụ na 1994.

Na Rwanda nanị, e gburu ihe dị ka 500,000 mmadụ, ihe karịkwara 2,000,000 ndị ọzọ ghọrọ ndị gbara ọsọ ndụ mgbe ime ihe ike tiwapụsịrị n’etiti ndị Tutsi na ndị Hutu. “A kpagburu Ndịàmà Jehova karịsịa,” ka akwụkwọ akụkọ Belgium bụ́ Le Soir na-akọ, “maka ọjụjụ ha jụrụ ibu ngwá agha.” Ndịàmà Jehova adịghị etinye aka ná mburịta agha. Ka o sina dị, e gburu ọtụtụ narị n’ime ha n’ime ihe ike ahụ. Nke a na-echetara anyị okwu Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya: “N’ihi na unu esiteghị n’ụwa, . . . ụwa na-akpọ unu asị.”—Jọn 15:19.

Otu ezinụlọ Ndịàmà—Eugène Ntabana, nwunye ya, na ụmụ ya abụọ—biri n’isi obodo, bụ́ Kigali. Mgbe ọ na-akọwara ndị agbata obi ya nnọpụiche ndị Kraịst, Eugène na-ekwukarị banyere bougainvillea, osisi vine na-arị eru nke na-eme nke ọma n’ihu igwe na-ekpo ọkụ.—Matiu 22:21.

“Ebe a na Kigali,” ka Eugène ga-akọwa, “bougainvillea na-emepụta okooko osisi na-acha ọbara ọbara, pinki pinki, na mgbe ụfọdụ na-acha ọcha. Ma, ha nile so n’otu ezinụlọ ahụ. Otú ahụkwa ka ọ dị ụmụ mmadụ. Ọ bụ ezie na anyị pụrụ ịbụ ndị agbụrụ, ụcha akpụkpọ ahụ, ma ọ bụ ebo dị iche iche, anyị nile so n’otu ezinụlọ ahụ, ezinụlọ nke ihe a kpọrọ mmadụ.”

N’ụzọ dị mwute, n’agbanyeghị ọdịdị udo na nguzo nnọpụiche ha, ìgwè na-eme ihe ike akpịrị ọbara na-akpọ nkụ gburu ezinụlọ Ntabana. Ma, ha nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi. Anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova Chineke ga-emezu nkwa ya nye ndị dị otú ahụ, a ga-emekwa ka ha si n’ọnwụ bilie iji keta ụwa ebe mbunobi na-agaghị adịkwa ọzọ. (Ọrụ 24:15) Mgbe ahụ, ezinụlọ Ntabana, tinyere ndị ọzọ, ga-abụ ndị ‘ịba ụba nke udo ga-atọ ụtọ.’—Abụ Ọma 37:11.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya