Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 12/1 p. 32
  • Olee Ndị Ga-abụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ndị Ga-abụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 12/1 p. 32

Olee Ndị Ga-abụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma?

N’OTU nzukọ nke Òtù Kansụl Chọọchị Ndị Dị n’Ụwa nwere n’ihe dị ka afọ 40 gara aga, a gbara ndị òtù ya ume “itiwapụ na mmụọ nke ikwusa ozi ọma” na ịkụziri ìgwè atụrụ ha “ijegharị na-eme nkwusa.” Afọ ise mgbe nke a gasịrị, John A. O’Brien, bụ́ onye ụkọchukwu ndị Katọlik, dere banyere mkpa ọ dị ịkpọbata ndị ọhụrụ na-eso ụzọ “site n’ijekwuru ha,” ọ bụghịkwa nanị “site n’ịnọdụ ala n’ụlọ anyị.” Na January 1994 kwa, Popu John Paul nke Abụọ kwuru na ọ “bụghị oge ime ihere n’Oziọma, ọ bụ oge isite n’elu ụlọ kwusaa ya.”

N’ụzọ doro anya ọ dịghị onye gere ntị n’òkù ndị a a na-akpọ site na mgbe ruo na mgbe. Otu isiokwu dị n’akwụkwọ akụkọ ndị Australia bụ́ llawarra Mercury kwuru, sị: “Ndị Katọlik a ma ama na South Coast enweghị ịnụ ọkụ n’obi ịnabata otú Ndịàmà Jehova si emeso okwukwe ha.” Otu nwoke kwuru na ikwusa ozi ọma ‘abụghị nnọọ akụkụ nke echiche ndị Katọlik.’ Onye ọzọ tụgharịrị n’uche, sị: “Ọ dị mma ka Chọọchị kpọsaa onwe ya, ma ọ bụghị site n’ịkụ aka n’ọnụ ụzọ. Ma eleghị anya isite n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ izipụ akwụkwọ ozi ga-aka mma.” O dochaghị ọbụna onye ụkọchukwu na-elekọta katidral dị n’ógbè ahụ anya ụzọ isi kọwaa ihe ndị popu kwuru. “Anyị ga-agba ndị mmadụ ume igosipụta Oziọma ahụ ha maara site ná ndụ nke ha,” ka o kwuru. “Ma nke ahụ ọ̀ pụtara ịkụ aka n’ọnụ ụzọ bụrịị ihe dị iche.” Isi akụkọ nke isiokwu akụkọ ahụ chịkọtara ya nke ọma, sị: “Ndị Katọlik agaghị ege ntị n’òkù Popu kpọrọ maka ime nkwusa.”

N’agbanyeghị ọdịda Krisendọm daworo n’ikwusa ozi ọma, ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova ise na-agbaso iwu Jisọs nyere bụ́ “gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Matiu 28:19, 20; tụlee Ọrụ 5:42.) Nkwusa site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ ha bụ nke a na-eme ugbu a n’ihe karịrị ala 230. Ozi ha na-eweta bụ nke dị mma, na-eme ka nkwa ndị dị ịtụnanya nke Bible maka ọdịnihu pụta ìhè. Gịnị ma i soro ha kwurịta okwu mgbe ọzọ ha bịara?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya