Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-agụ
Dị ka akụkọ na-egosi, mgbe a mụsịrị nwa ọhụrụ, ụlọ ọgwụ ụfọdụ na-echekwa ichi na alọ iji wepụtasịa ihe n’ọbara ha. Nke a ò kwesịrị ichegbu onye Kraịst?
N’ọtụtụ ebe, ihe yiri nke ahụ adịghị eme, ya mere ọ dịghị ndị Kraịst mkpa inwe nchegbu. Ọ bụrụ na e nwere ezi ihe mere a ga-eji kwere na a na-agbaso usoro dị otú ahụ n’ụlọ ọgwụ ebe onye Kraịst ga-amụ nwa, ọ ga-ekwesị ekwesị nanị ịgwa dibịa ahụ na e kwesịrị ịtụfu ichi na alọ ahụ, n’ejighị ha mee ihe n’ụzọ ọ bụla.
E sitewo n’ihe ndị dị ndụ nweta ihe nlekọta ahụ ike dị iche iche, ma hà bụ anụmanụ ma ọ bụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, e siwo na mamịrị ịnyịnya dị ime wepụta ụdị ụfọdụ nke mmiri ọgwụ ahụ bụ́ hormone. E siwo n’ọbara ịnyịnya nweta ọgwụ ọrịa tetanus, ọ dịwokwa anya e si n’ọbara dị n’ichi mmadụ (ihe na-eso nwa) nweta gamma globulin iji lụso ọrịa ọgụ. Ụfọdụ ụlọ ọgwụ agbasiwo ichi ndị ahụ, otu ebe nnyocha ụlọ ọrụ na-eme ọgwụ emesịakwa were ha ka e wee nwee ike imegharị ọbara nke ihe ndị dị n’ahụ na-alụso ọrịa ọgụ jupụtara iji wepụtasịa gamma globulin.
N’oge na-adịbeghị anya, ndị na-eme nnyocha azọrọwo na ha nwere ihe ịga nke ọma n’iji ọbara sitere n’ichi mee ihe n’ịgwọ otu ụdị nke ọrịa leukemia, e chepụtawokwa na ọbara dị otú ahụ pụrụ ịba uru n’ụfọdụ ọrịa usoro ịlụso ọrịa ọgụ ma ọ bụ n’ọnọdụ mbugharị nke ụmị ọkpụkpụ. N’ihi ya, e nwewo ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke mgbasa akụkọ banyere ndị mụrụ ụmụ iwepụta ọbara site n’ichi, gbasie, ma chekwaa ya, n’amaghị ma ikekwe à pụrụ iji ya gwọọ nwa ha n’afọ ndị dị n’ihu.
Azụmahịa dị otú ahụ e ji ọbara ichi eme abụghị ihe na-adọrọ adọrọ nye ezi ndị Kraịst, bụ́ ndị ji iwu Chineke zuru okè eduzi iche echiche ha. Onye Okike anyị na-ele ọbara anya dị ka ihe dị nsọ, na-anọchite anya ndụ Chineke na-enye. Nanị ihe e ji ọbara eme nke o nyere ikike ya bụ n’elu ebe ịchụàjà, n’ihe metụtara àjà. (Levitikọs 17:10-12; tụlee Ndị Rom 3:25; 5:8; Ndị Efesọs 1:7.) Ma ọ bụghị ya, a gaje ịwụsị ọbara e wepụtara site n’ihe e kere eke n’ala, wụfuo ya.—Levitikọs 17:13; Deuterọnọmi 12:15, 16.
Mgbe ndị Kraịst na-achụ nta anụ ma ọ bụ gbuo ọkụkọ ma ọ bụ ezì, ha na-egbupụ ya ọbara ma wụfuo ya. Ọ bụghị iwu na ha ga-awụsa ya n’ala n’ụzọ nkịtị, n’ihi na ihe bụ isi bụ na ha na-awụfu ọbara ahụ kama iji ya mee ihe ọ bụla.
Ndị Kraịst bụ́ ndị e nyere àkwà n’ụlọ ọgwụ na-aghọta na a na-atụfu akụkụ ahụ ndị e wepụrụ ha n’ahụ, ma ihe ahụ hà bụ ihe ahụ na-achọghị, uru ahụ nwere ọrịa, ma ọ bụ ọbara. N’eziokwu, onye dọkịta pụrụ ịchọ ka e buru ụzọ mee nnyocha ụfọdụ, dị ka ule mamịrị, nnyocha ọrịa a na-eme iji mata uru ahụ nwere akpụ, ma ọ bụ ule ọbara. Ma mgbe e mesịrị, a na-awụfu ihe ndị ahụ dị ka iwu ndị e nwere n’ebe ahụ si dị. Ọ na-esikarị ike onye ọrịa nọ n’ụlọ ọgwụ ịrịọ arịrịọ pụrụ iche banyere nke a n’ihi na ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na ihe amamihe ịtụfu ihe ndị dị otú ahụ sitere n’ahụ. Ọ bụrụ na onye ọrịa nwere ezi ihe mere ọ ga-eji nwee obi abụọ ma à gaje ịgbaso usoro kwesịrị ekwesị dị otú ahụ, onye ahụ pụrụ ịkọrọ ya dibịa ahụ o metụtara, na-ekwu na n’ihi ihe ndị metụtara okpukpe, na ya chọrọ ka a wụfuo ihe ndị dị otú ahụ.
Otú ọ dị, dị ka e kwuworo, o siri ike nke a ịbụ nsogbu nye onye ọrịa n’ihi na n’ọtụtụ ebe, a dịghị ọbụna atụle ichekwa ihe na-eso nwa ma ọ bụ ihe ndị sitere n’ahụ dị otú ahụ na iji ha meghachi ihe, ma ya fọdụ ịbụ nke a na-eme mgbe mgbe.
Isiokwu bụ “Ka Anyị Kpọọ Ihe Ọjọọ Asị,” nke pụtara ‘n’Ụlọ Nche’ nke January 1, 1997, yiri ka ọ na-elekwasị anya n’idina ụmụaka. Olee otú a ga-esi akọwa omume a?
Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary na-akọwa “idina ụmụaka” dị ka “mmekọahụ rụrụ arụ nke ọ bụ ụmụaka ka a na-ahọrọ idina.” A katọrọ akụkụ dị iche iche nke omume a na Deuterọnọmi 23:17, 18. N’ebe ahụ Chineke kwugidere ịghọ nwoke e doro nsọ ịkwa iko (“ma ọ bụ, ‘nwata a na-edina edina,’ nwata nwoke e debere n’ihi nzube mmekọahụ rụrụ arụ,” nkọwa ala ala peji NW ). Amaokwu ndị a machibidokwara onye ọ bụla iwu iwebata ‘n’ụlọ Jehova’ ọnụ ahịa e retere ná “nkịta” (“ma eleghị anya onye na-ara otule; onye na-enwe mmekọahụ site n’otule, karịsịa na-eji nwata nwoke,” nkọwa ala ala peji NW ). Ntụaka ndị a nke Akwụkwọ Nsọ na nke ụwa na-eguzobe na ihe Ụlọ Nche na-atụle bụ nwata ịbụ onye onye toro eto na-emetọ n’ụzọ mmekọahụ, na-agụnye mpịgharị aka.