Mmeri Ọzọ Nye Ndịàmà Jehova Nọ na Gris
N’OCTOBER 6, 1995, òtù mmadụ atọ nke Ụlọikpe Majie dị n’Atens nụụrụ okwu ikpe nke metụtara ndị ozi oge nile abụọ nke Ndịàmà Jehova. Ebubo e boro ha bụ ime ntọghata, otu onye ọrụ uwe ojii wegara okwu ahụ n’ụlọikpe mgbe Ndịàmà ahụ jesịrị ebe obibi ya.
Ajụjụ ndị onye ọkàikpe nọ n’isi oche jụrụ gosiri na o nwere nnọọ mmasị n’ọrụ Ndịàmà Jehova. Dị ka ihe atụ, ọ jụrụ, sị: “Ruo ogologo oge hà aṅaa ka unu nọworo na-arụ ọrụ a? Olee otú ndị mmadụ siworo na-emeso unu kemgbe afọ ndị a? Ụdị nzaghachi dị aṅaa ka a nọworo na-enye ọrụ unu? Gịnị ka unu na-agwa ndị mmadụ n’ọnụ ụzọ ha?” Ndị nile nọ n’ụlọikpe gere ntị nke ọma n’ezi àmà nke a gbara.
N’ịbụ ihe ijuanya nye Ndịàmà, ọbụna ọkàiwu gọọmentị kwulaara ha okwu. “Ndịàmà Jehova nwere ikike ndị ụkpụrụ iwu kwadoro ọ bụghị nanị ikwere na Chineke ha na ife ya ofufe,” ka o kwuru n’okwu mmechi ya, “kamakwa ịgbasa okwukwe ha site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ, n’ámá, na n’okporo ámá, ọbụna na-ekesa akwụkwọ ha n’efu ma ha chọọ.” Ọkàiwu ahụ zoro aka ná mkpebi ikpe dị iche iche ụlọikpe na Kansụl nke Steti nyere. O zokwara aka n’okwu ikpe nke Kokkinakis v. Greece, bụ́ nke Ụlọikpe Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ nke Europe kpelaara Ndịàmà Jehova.a “Biko rịba ama,” ka ọkàiwu ahụ dọrọ aka ná ntị, “na Gris ọbụna kwụrụ nhá n’okwu ikpe a. Ya mere anyị kwesịrị ịkpachara nnọọ anya mgbe a kpọrọ anyị ikpe ikpe dị otú ahụ. N’ezie, e kwesịghị ma ọlị iweta okwu ikpe ndị a n’ụlọikpe ná mmalite.”
Mgbe ọkàikpe ahụ kwusịrị okwu, e nwekebeghị ihe fọọrọ ọkàiwu Ndịàmà ikwu. Ka o sina dị, o weere ohere ahụ mesie ike na iwu ime ntọghata ekwekọghị n’ụkpụrụ iwu nakwa na ọ nọwo na-emechu Gris ihu ná mba nile.
Nanị ihe ọkàikpe nọ n’isi oche mere bụ ile ọkàikpe abụọ ndị ọzọ anya, ha ejirikwa otu olu tọhapụ nwanna nwoke na nwanna nwanyị ahụ. Ikpe ahụ, bụ́ nke dịruru otu hour na minit iri, bụ mmeri nye ma aha Jehova ma ndị ya.
Nke a bụ ntọhapụ nke anọ metụtara okwu ikpe metụtara ime ntọghata mgbe Ụlọikpe Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ nke Europe nụrụsịịrị okwu ikpe nke Kokkinakis. Ndịàmà Jehova nọ na Gris na-aṅụrị ọṅụ na nsogbu ndị e jikọrọ ha na ime nkwusa ha adịkwaghị ugbu a nakwa na o kwere omume ịga n’ihu n’ọrụ ahụ n’enweghị ihe mgbochi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]