Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 4/1 p. 30-31
  • Alụmdi na Nwunye Dị Afọ 403 Nọ ná Nsogbu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Alụmdi na Nwunye Dị Afọ 403 Nọ ná Nsogbu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 4/1 p. 30-31

Alụmdi na Nwunye Dị Afọ 403 Nọ ná Nsogbu

NA Sweden, Chọọchị na Ọchịchị enwewo mmekọrịta chiri anya ruo ihe karịrị afọ 400. Ugbu a alụmdi na nwunye dị n’etiti okpukpe na ọchịchị na-ada ada.

E guzobere okpukpe Lutheran dị ka okpukpe Ọchịchị na 1593, ndị Sweden nile aghaghịkwa ịghọ ndị òtù ya e mere baptism. Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, n’afọ ndị 1850, e mere otu mgbanwe. Ọ dịghịkwa mkpa na a ga-eme ndị Sweden baptism; otú o sina dị, a ka weere ha dị ka ndị òtù nke Chọọchị Lutheran. N’ihi ya, a chọrọ ka ha kwụọ 1 pasent nke ego ha na-akpata nke a na-atụrụ ụtụ isi iji kwadoo chọọchị ahụ na iji kwụọ ụgwọ ọrụ obodo ụfọdụ chọọchị na-arụ. Na nso nso a karị mgbanwe ọzọ weere ọnọdụ. Malite na 1952, ndị Sweden pụrụ ịhapụ chọọchị ahụ dị ka iwu kwadoro, wee si otú a bụrụ ndị a gụpụrụ n’ịkwụ ihe dị ukwuu n’ụtụ isi chọọchị ahụ.

N’afọ ndị na-adịbeghị anya Chọọchị Lutheran anọgidewo na-ada ná nchịkwa o nwere na Sweden. A pụghị izere nke a, ebe 10 pasent nke ndị bi na Sweden bụ ndị si mba ọzọ kwabata na-abụghị ndị Lutheran, gụnyere ndị Juu, ndị Katọlik, na ndị Alakụba. N’ihi ya, ná mmalite nke 1996, ọ bụ nanị 86 pasent nke ndị Sweden bụ ndị Chọọchị Lutheran, ọnụ ọgụgụ ahụ nọgidere na-adalata.

Enweghị mmasị ahụ na-arị elu na-akpata nkewa n’etiti Chọọchị na Ọchịchị. Ka ọ dị ugbu a, a kpọsawo na ọ dịghị mkpa na eze ga-abụ onye Lutheran, a dịghịkwa ewere ụmụ a mụụrụ nne ma ọ bụ nna onye Lutheran ozugbo ahụ dị ka ndị òtù nke Chọọchị Ọchịchị Lutheran. Ọzọkwa, dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Dallas Morning News si kwuo, ka ọ na-erule afọ 2000, “parish ndị dị ebe ahụ na ọchịchị aghaghị ime mpịazi ma kewasịa ọtụtụ ihe onwunwe bara ụba. Chọọchị aghaghị igbubilata atụmatụ mmefu ego mgbaafọ ya nke ijeri $1.68, nke a na-anakọta ihe ka ukwuu n’ime ya site n’ụtụ isi.” Mgbe narị afọ a gwụsịrị, chọọchị ahụ ga-eji aka ya họpụta ndị bishọp ya.

Ọ bụ ezie na enweghị mmasị na ndalata nke ndị òtù na-eti Krisendọm ihe otiti, Ndịàmà Jehova na Sweden nọgidere na-eto eto. 1997 Yearbook of Jehovah’s Witnesses na-akọ na e nwere ndị nkwusa Alaeze Chineke 24,487 n’ala ahụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 10 pasent na-eme nkwusa dị ka ndị ozi ọsụ ụzọ oge nile. Ọtụtụ n’ime ndị a na-eru eru maka ihe ùgwù ije ozi ndị ka ukwuu. Dị ka ihe atụ, n’oge mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova nke 1995, di na nwunye 20 tinyere akwụkwọ maka ọzụzụ ozi ala ọzọ n’ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead. N’oge ahụ, e nwere ihe dị ka ndị Sweden 75 gụsịworo akwụkwọ na klas ndị gaworo aga ndị nọ n’ozi ala ọzọ n’akụkụ dị iche iche nke ụwa. Obi abụọ adịghị ya na ezi ihe nlereanya ha na akwụkwọ ozi na nleta ha na-agba ume na-enwe mmetụta na-akpali akpali n’ahụ ndị na-atụle ihe ùgwù a dị ebube ugbu a.

N’ihi ya, ka nde ndị Krisendọm na-enwe ndakpọ nke mmụọ, Ndịàmà Jehova ‘na-eti mkpu ọṅụ site n’obi dị mma.’—Aịsaịa 65:13, 14.

[Map dị na peeji 30]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Sweden

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya