Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 7/15 p. 32
  • “Akụ̀ nke Eziokwu”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Akụ̀ nke Eziokwu”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 7/15 p. 32

“Akụ̀ nke Eziokwu”

“Akụ̀ nke eziokwu.” Nke ahụ bụ otú otu akwụkwọ ozi e degaara alaka dị na Nigeria nke Ndịàmà Jehova si na-akọwa magazin abụọ pụrụ iche. Onye dere ya, bụ́ otu nwa okorobịa, na-akọwa, sị:

“Ana m ede akwụkwọ a iji kwupụta ezigbo ekele m maka mgbalị unu n’ịrụtụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị aka site na magazin Ụlọ Nche na Teta!

“Adị m afọ 17. N’afọ gara aga ụlọ ọrụ redio dị n’ógbè anyị haziri asọmpi edemede n’isiokwu bụ́ ‘E Nwere Ihe Dị n’Ịhụnanya Karịa Mmekọahụ—Ọrịa AIDS Dị n’Ezie.’ Edemede nke ọ bụla aghaghị iru narị okwu anọ. A ga-enye ihe nrite nke naira 1,000 [$12.50, U.S.] maka edemede kasị mma. Otú ọ dị, ha kwuru na ndị mmadụ kwesịrị ide ihe ọ bụghị nanị iji rite ihe, kama nke ahụ, iji mụta ihe. . . .

“Achọtara m ihe ọmụma banyere ọrịa AIDS na magazin abụọ ahụ. Banyere ịhụnanya, e nwere ụba isiokwu. Ejiri m isi ihe ndị sitere na Teta! nke August 8, 1978 [Bekee], mee ihe.

“Ihe na-eruchaghị ọnwa abụọ m zigasịrị edemede m, rịzọlt pụtara. N’ịbụ ihe ijuanya nye m, agbara m onye mbụ na steeti Cross River na Akwa Ibom!

“Ihe ọmụma nile m jiri mee ihe sitere na magazin ndị ahụ. Ọ bụ n’ezie ihe dị ebube na Jehova na-enye anyị ihe ọmụma bịara n’oge ya n’ụwa a nọ ná nsogbu, nke na-arịakwa ọrịa. Dị ka ezi ndị Kraịst, anyị maara na e nwere nnọọ nnukwu ihe dị n’ịhụnanya karịa mmekọahụ. N’eziekwa, ibi ndụ dị ọcha, nke omume ọma na-echebe anyị pụọ n’ọrịa ndị dị ka AIDS.

“Aghaghị m ikele unu maka akụ̀ nke eziokwu ndị a unu na-ebipụta n’enweghị ike ọgwụgwụ. Ka Jehova nọgide na-agọzi mgbalị unu ka unu na-anọgide na-ebipụta magazin ndị a dị oké ọnụ ahịa.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya