Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ọ Chọtara “Pearl Dị Oké Ọnụ Ahịa”
“ALAEZE eluigwe yiri onye ahịa na-achọ pearl ọma: ma mgbe ọ hụrụ otu pearl dị oké ọnụ ahịa, o jee, ree ihe nile o nwere, ka ha hà, wee zụta ya.” Site n’okwu ndị a, Jisọs gosiri uru ka ukwuu nke Alaeze Chineke. (Matiu 13:45, 46) Ndị matara uru Alaeze ahụ na-achụkarị àjà onwe onye iji nweta ya. E gosiri nke a site n’ahụmahụ na-esonụ nke sitere Ógbè Pingtung, Taiwan.
Na 1991, Maazị na Oriakụ Lin malitere isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Mgbe otu onye ụkọchukwu ebe ahụ chọpụtara, ọ gbalịrị ime ka ha sonye na chọọchị ya. Ebe ọ bụ na ezinụlọ Lin na-azụ ahịa ọbara ezì na ọbọgwụ n’ahịa obodo, ha kpebiri ịjụ ụkọchukwu ahụ echiche ya n’okwu ahụ. “Ihe nile Chineke meworo pụrụ ịbụrụ mmadụ nri,” ka ọ zaghachiri. Ndịàmà, n’aka nke ọzọ, gbara ha ume ịtụle ihe Okwu Chineke nwere ikwu. Ha mụtara na Jehova Chineke na-ewere ọbara dị ka ihe dị nsọ, n’ihi na “ndụ nke ihe e kere eke bụ ọbara ya.” (Levitikọs 17:10, 11, The New English Bible) Ya mere ezi ndị Kraịst aghaghị ‘ịhapụ ọbara.’ (Ọrụ 15:20) N’ihi inyocha Akwụkwọ Nsọ n’isiokwu a, ezinụlọ Lin kpebiri ịkwụsị ire ọbara, ọ bụ ezie na ha na-esi na ya enweta ihe dị ukwuu n’ego ha. Otú ọ dị, n’ime mkpirikpi oge, ha chere ule ka ukwuu ihu.
Tupu ha amụta eziokwu ahụ, ezinụlọ Lin akụwo osisi akị betel 1,300 n’ala ha. Ọ bụ ezie na ọ ga-ewe afọ ise ka osisi ndị ahụ wee malite iweta uru, ozugbo ha malitere ịmịpụta mkpụrụ n’ụba, ezinụlọ Lin pụrụ ịtụ anya ịkpata $77,000 kwa afọ. Ka oge owuwe ihe ubi nke mbụ bịaruru nso, ezinụlọ Lin aghaghị ime mkpebi dị mkpa. Ha amụtawo site n’ọmụmụ Bible ha na ndị Kraịst aghaghị ịsachapụ onwe ha “mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ” site n’izere iji, ma ọ bụ ịkwalite, àgwà ndị dị otú ahụ na-adịghị ọcha dị ka ise ụtaba, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na ịta akị osisi betel eme ihe. (2 Ndị Kọrint 7:1) Gịnị ka ha ga-eme?
Ná nrụgide site n’akọ na uche nwere nsogbu, Maazị Lin kpebiri ịkwụsị ọmụmụ ihe ya. Ka ọ dị mgbe ahụ, Oriakụ Lin rere akị osisi betel site n’ụfọdụ osisi ochie ha ma rite uru karịrị $3,000. Nke a bụ nnọọ ndetụ ire nke ihe ga-abịanụ n’oge na-adịghị anya ma ọ bụrụ na ha ahapụ osisi ha. Otú ọ dị, akọ na uche Maazị Lin nọgidere na-eti ya ihe.
Ya na okwu ahụ gbagidere mgba ruo otu ụbọchị ọ rịọrọ Ndịàmà ógbè ahụ ka ha gbutuoro ya osisi akị betel ya. Ndịàmà ahụ kọwara na ọ bụ mkpebi ọ ga-emere onwe ya; n’ihi ya, ọ ghaghị ‘iburu ibu nke aka ya’ ma gbutuo osisi ndị ahụ n’onwe ya. (Ndị Galetia 6:4, 5) Ha gbara ya ume icheta nkwa ahụ dị ná 1 Ndị Kọrint 10:13, nke na-asị: “Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla nwaworo unu ma ọ bụghị nke mmadụ na-anagide: ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, Onye na-agaghị ekwe ka a nwaa unu karịa nke unu pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ Ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike ịnagide ya.” Ndịàmà ahụ sokwaara ya tụgharịa uche, na-asị: “Ọ bụrụ na anyị egbutuoro gị osisi gị, ị pụrụ ịkwa ụta maka ya ma taa anyị ụta maka mfu ya.” Nwa oge nta mgbe e mesịrị, ụda ígwè e ji egbutu osisi kpọtere Oriakụ Lin n’ụra. Di ya na ụmụ ya na-egbutu osisi akị betel ndị ahụ!
Maazị Lin chọpụtara na Jehova na-emezu nkwa Ya. O nwetara ọrụ nke nyere ya akọ na uche dị ọcha, na-eme ka o nwee ike ịbụ onye na-enye Jehova otuto. E mere ya baptism n’otu mgbakọ sekit nke Ndịàmà Jehova n’April 1996.
Ee, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Maazị Lin ‘rere ihe nile o nwere’ wee zụta “pearl dị oké ọnụ ahịa.” Ugbu a o nwere ihe ùgwù na-enweghị atụ nke ya na Jehova Chineke inwe mmekọrịta onwe onye na ijere ọdịmma Alaeze Ya ozi.