Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ndị Ntorobịa Etoo Chineke na Democratic Republic Of Congo
ỌTỤTỤ narị afọ gara aga, onye ọbụ abụ kpọrọ ndị na-eto eto òkù n’ụzọ na-ekpo ọkụ ka ha soro n’ito Eze nke mgbe ebighị ebi: “Ma ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọ; ndị agadi, ha na ụmụntakịrị: ka ha too aha Jehova; n’ihi na e mewo ka aha Ya dị elu, nanị ya.” (Abụ Ọma 148:12, 13) Ahụmahụ ndị na-esonụ sitere Democratic Republic of Congo na-eme ka ihe ùgwù a na-enweghị atụ pụta ìhè.
• Omume Ndịàmà Jehova nwere mmetụta dị mma n’ahụ otu onye nwe ụlọ ebe otu ọsụ ụzọ pụrụ iche bi. N’ihi ya, o kwere ka nwa ya nwanyị gbara afọ ise, bụ́ Fifi, soro Ndịàmà na-amụ Bible. Mgbe ọ hụsịrị ọganihu Fifi n’ịmụ Akwukwọm nke Akukọ Bible,a nna ya hapụrụ ya ka ọ gawa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ebe ahụ, obere Fifi mụtara abụ Alaeze site n’akwụkwọ abụ Ndịàmà. Abụ nke 4, nke isiokwu ya bụ “Nkwa Chineke Maka Paradaịs,” masịkarịsịrị ya.
Otu ụbọchị nna Fifi kpebiri ịkpọ ya gaa chọọchị ya. N’ụzọ juru onye ọ bụla anya, Fifi jụrụ ịbụ abụ chọọchị ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na o kwenyere na abụ ndị a na-abụ na chọọchị nna ya ekwekọghị n’ihe ọ mụtara n’ọmụmụ Bible ya. Kama nke ahụ, o ji obi ike bụọ abụ Alaeze nke na-amasịkarịsị ya.
Ka ọtụtụ mgbalị na-agaghị nke ọma iji gbanwee obi ya gasịrị, ndị ndú chọọchị ahụ kpebiri ịchụpụ Fifi gbara afọ ise! N’agbanyeghị mmeso ọjọọ a, nna ya nọgidere jụụ. O nwere obi ụtọ na Fifi eguzosiwo ike n’ihe o kwenyere. Nne na nna Fifi chọchara ka ọ nọgide na-eso Ndịàmà Jehova.
• Mgbe otu nwa okoro nọ n’afọ iri na ụma aha ya bụ Lukodi kpebiri iso Ndịàmà Jehova mụọ Bible, nna ya megidesiri ya ike. N’otu oge mgbe Lukodi na-ejikere ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, nna ya ji mma oge yie ya egwu. N’oge ọzọ nna Lukodi kụrụ ya osisi, na-akụnye ọnyá miri emi n’azụ ya. N’agbanyeghị oké mmegide ahụ, Lukodi nọgidesiri ike ná mkpebi ya ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ nọgidere na-enwe ọganihu ma bụrụ onye e mere baptism. Ugbu a ọ na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ oge nile.
Nguzo nwanne ya nwoke metụtara Sona, nwanne Lukodi nke nwanyị ọ tọrọ, n’obi nke ukwuu nke na ọ malitekwara iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Otú ọ dị, iji gbochie ya ịmụ ihe, nna ha zigara Sona n’ụlọ akwụkwọ dị n’obodo nta ọzọ, ebe Ndịàmà na-anọghị. Ka o sina dị, Sona mere ya àgwà ya ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ndị ọ mụtaworo. N’ihi ya, nwa nwanne ya nwekwara mmasị.
Mgbe Ndịàmà si n’otu obodo nta gbara ya agbata obi nụrụ banyere ọrụ ime nkwusa nke Sona, ha letara ya ma mee ndokwa ka ọ na-enwe ọmụmụ Bible ebe obibi chiri anya. Ọ nọgidere na-enwe ọganihu ma sonyere nwanne ya nwoke n’oge na-adịghị anya dị ka Onyeàmà Jehova nke raara onwe ya nye, e mekwara baptism. Ọzọkwa, ugbu a nwa nwanne ya bụ onye nkwusa a na-emebeghị baptism, a na-enwekwa ọmụmụ akwụkwọ n’obodo nta a.
Lee ka o si bụrụ ihe magburu onwe ya ma na-enye ume ọhụrụ mgbe ụmụntakịrị sonyere n’ito aha Jehova!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.