Iwu Iri Ahụ
BISHỌP nke Gloucester nke England chọpụtara na ihe karịrị ọkara ndị ụkọchukwu na dayọsis ya apụghị ịgụghachi Iwu Iri ahụ, 10 pasent n’ime ha amaghịkwa ebe a ga-achọta ha n’ime Bible. Ma nke ahụ bụ afọ 450 gara aga. Ọnọdụ ahụ ọ̀ kala mma kemgbe ahụ? Ọ dịghị ma ọlị—dị ka nnyocha ọhụrụ nke The Sunday Times mere ndị ụkọchukwu Anglịkan aghara aghara si kpughee.
N’ime ndị ụkọchukwu 200 a gbara ajụjụ ọnụ, nanị 34 pasent pụrụ ihota Iwu Iri ahụ nile. N’ime ndị ọzọ, otu chere na ha na-ejichi mmadụ gabiga ókè, onye ọzọ wezụgakwara ha n’ụsọ dị ka ihe na-emetụtaghị ihe ịma aka nke omume ọma n’oge a.
Ị̀ maara Iwu Iri ahụ ma ọ bụ ebe a ga-achọta ha? E dekọrọ ha n’Ọpụpụ, akwụkwọ nke abụọ nke Bible, amaokwu 17 mbụ nke isi nke 20. Gịnị ma ị gụọ ha? Nke a bụ ụzọ dị mfe iji hazie ha. Anọ ndị mbụ metụtara ofufe anyị na-efe Chineke, nke ise na-eme ka ndụ ezinụlọ pụta ìhè, nke isii ruo itoolu gbasara mmekọrịta anyị na mmadụ ibe anyị, nke iri pụkwara iche, na-eme ka anyị nyochaa obi nke anyị, tụlee ebumnobi anyị. Nke a bụ nchịkọta dị nkenke nke ụzọ ndị Kraịst pụrụ isi tinye ụkpụrụ ndị a n’ọrụ.
Nke mbụ: Nye Onye Okike anyị ofufe a na-ekewaghị ekewa. Nke abụọ: Ejila ihe oyiyi na-efe ofufe. Nke atọ: Sọpụrụ ma kwanyere aha Chineke ùgwù mgbe nile. Nke anọ: Wepụta ohere maka ịtụkwasị uche n’okwu ime mmụọ, n’enweghị ndọpụ uche. Nke ise: Ụmụaka, kwanyerenụ nne na nna unu ùgwù. Nke isii: Egbula mmadụ. Nke asaa: Zere ịkwa iko. Nke asatọ: Ezula ohi. Nke itoolu: Na-ekwu eziokwu. Nke iri: Zere anyaukwu.
Iwu Iri ahụ bụ akụkụ ụkpụrụ iwu e nyere Mosis. Ma ụkpụrụ ndị dị n’ime ha bụ ndị oge ha na-adịghị agafe agafe. (Ndị Rom 6:14; Ndị Kọlọsi 2:13, 14) N’ihi nke a, ndị na-eso ụzọ Jisọs hotara ma zoo aka n’Iwu Iri ahụ. (Ndị Rom 13:8-10) Lee ka ndụ ga-esi abụ ihe obi ụtọ karị—dịkwa nchebe karị—taa ma ọ bụrụ na mmadụ nile akwanyere ụkpụrụ ndị a e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee ùgwù ma bie ndụ kwekọrọ na ha!