Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 1/1 p. 32
  • Nzaghachi Na-ama Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzaghachi Na-ama Aka
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 1/1 p. 32

Nzaghachi Na-ama Aka

CATHOLIC HERALD, bụ́ akwụkwọ akụkọ Roman Katọlik nke Britain, bipụtara na nso nso a akwụkwọ ozi sonụ nke si n’aka onye na-agụ ya na Wales: “Otu abalị, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ọnụ ụzọ m. Ejisiri m ike kwuo na ọ bụ Chọọchị Katọlik mere ka e jide ịbụ eziokwu nke Agba Ọhụrụ ha hotara n’aka. Dị ka ihe ijuanya nye m, otu n’ime ha kwetara. ‘Ee,’ ka o kwuru, ‘unu na-eme ka e jide ya n’aka ma unu adịghị agbaso ya. Jisọs kwuru, sị, “unu hụrịta ibe unu n’anya, dị ka m hụrụ unu n’anya,” ma unu na-egburịta ibe unu. N’agha gara aga, ndị Katọlik gburu ndị Katọlik, ma ọ dịghị Onyeàmà Jehova gburu Onyeàmà [ibe ya].’ Gịnị ka m pụrụ ime ma ọ bụghị ikwere? Olee otú anyị pụrụ isi kpee ekpere ka anyị na ‘ụmụnna anyị e kewapụrụ ekewapụ’ dị n’otu mgbe ọ na-adịghị ezi ịdị n’otu dị n’etiti anyị onwe anyị? Ó kwesighị ka anyị buru ụzọ dozie akụkọ ọjọọ a?”—Jọn 15:12.

Agha ụwa abụọ nke narị afọ nke 20 a bidochara na Krisendọm wee taakwa isi ihe dị ka nde mmadụ 50 ruo nde 60. Otú ọ dị, a pụrụ ikwu n’eziokwu na Ndịàmà Jehova ekereghị òkè n’agha ndị ahụ, aka ha adịghịkwa n’esemokwu ọ bụla na-ewere ọnọdụ ugbu a. Olee otú nke a si kwe omume? Ọ ga-abara gị uru ịchọpụtakwu banyere nkekọ dị ike nke ịhụnanya ndị Kraịst na ịdị n’otu nke ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova ise nwere gburugburu ụwa.—Tụlee Aịsaịa 2:4.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

U.S. National Archives photo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya