Ha Na-eto Onye Okike Ha n’Ekwughị Okwu
ỌDỊDA anyanwụ mara oké mma site n’okike. Ma ịhụ anyanwụ ka ọ na-ada n’azụ ugwu nke a kpọmkwem n’Usoro Ugwu Apuane nke Tuscany, Itali, enweghị nnọọ atụ.
N’ile ya anya site n’ebe dị anya, anyanwụ na-eyi ka ọ na-adabanye n’ime ugwu ahụ kama ịda n’azụ ya. N’ihi gịnị? N’ihi na ọnụ ọnụ ugwu a nwere ebe gbara ngọ si n’okike nke yiri ka e si n’ugwu ahụ wapụta ya. N’ezie, aha e nyere ugwu a dịbanyere na mmiri kwesịrị ya, bụ́ Monte Forato—Ugwu A Dụpuru Adụpu. N’ihi gburugburu ụwa na-agba anyanwụ, nanị ugbo abụọ n’afọ ka ndị na-elefere anya site n’ebe ahụ gbara ngọ pụrụ ịhụ ka anyanwụ yiri ka ọ̀ na-adabanye n’ime Monte Forato.
Dị ka akụkụ ndị ọzọ nke okike, eluigwe na-adịghị ndụ na-enye Onye Okike ha otuto. N’ụzọ dị aṅaa? N’otu ụzọ ahụ ihe osise mara mma pụrụ iwetara onye sere ya otuto. N’ezie, ihe ndị dị na mbara igwe na-ekwu banyere ike, amamihe, na ebube Jehova. Dị ka ọbụ abụ ahụ si kwuo ya, “eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka Ya ka mbara eluigwe na-egosi.” (Abụ Ọma 19:1; 69:34) Ebe anyanwụ na ihe ndị ọzọ na-adịghị ndụ na-enye Onye Okike ha otuto, lee ka ọ na-aghaghị isi kwesị ekwesị anyị ime otú ahụ karị!—Abụ Ọma 148:1, 3, 12, 13.