“Ọ Bụ Interlinear Agba Ọhụrụ Kasị Mma E Nwere”
OTÚ ahụ ka Dr. Jason BeDuhn si kọwaa The Kingdom Interlinear Translation of the Greek Scriptures. Ọ na-akọwa, sị:
“M ka kụzisịrị otu ihe ọmụmụ maka Ngalaba Ọmụmụ Ihe Okpukpe nke Mahadum Indiana, Bloomington, [U.S.A.] . . . Nke a bụ n’ụzọ bụ isi ihe ọmụmụ n’Oziọma ndị ahụ. Enyemaka unu bịara n’ụdị The Kingdom Interlinear Translation of the Greek Scriptures bụ́ ndị ụmụ akwụkwọ m jiri mee ihe dị ka otu n’ime akwụkwọ ọgụgụ klas ahụ. Obere mpịakọta ndị a bara oké uru nye ihe ọmụmụ ahụ ma bụrụ nke ụmụ akwụkwọ m nakweere nnọọ.”
N’ihi gịnị ka Dr. BeDuhn ji jiri nsụgharị Kingdom Interlinear mee ihe n’ihe ọmụmụ kọleji ya? Ọ na-aza: “N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ bụ interlinear Agba Ọhụrụ kasị mma e nwere. Abụ m ọkà mmụta Bible a zụrụ azụ, mara akụkụ ihe odide na ngwá ọrụ e ji eme ihe n’ọmụmụ Bible nke oge a, ma, ka m kwuokwa, abụghị m onye òtù Ndịàmà Jehova. Ma ama m mbipụta dị mma mgbe m hụrụ ya, ‘Kọmitii Nsụgharị Bible Ụwa Ọhụrụ’ unu arụwo ọrụ ya nke ọma. Nsụgharị Bekee interlinear unu ziri ezi ma nweekwa nkwekọ ruo na nsọtụ nke na-amanye onye na-agụ ya ịtụle oghere asụsụ, ọdịnala, na echiche dịnụ n’etiti ndị na-asụ Grik na nke anyị onwe anyị. ‘Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ’ unu bụ nsụgharị nkịtị bụ́ ọkpọka nke na-ezere nkọwahie ọkpụtọrọkpụ ná nrapagidesi ike ya na Grik. N’ọtụtụ ụzọ, ọ ka ihe ka ukwuu ná nsụgharị ndị nwere ihe ịga nke ọma e ji eme ihe taa mma.”
Ndịàmà Jehova na-ebipụta The Kingdom Interlinear Translation of the Greek Scriptures iji nyere ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya aka ịmata ihe odide Grik mbụ nke Bible. O nwere The New Testament in the Original Greek n’akụkụ aka ekpe nke peji (nke B. F. Westcott na F. J. A. Hort chịkọtara). Nsụgharị Bekee nke okwu nke ọ bụla dị n’okpuru ahịrị ihe odide Grik. Na kọlụm aka nri dị warara ka New World Translation of the Holy Scriptures dị, bụ́ nke na-eme ka i nwee ike iji nsụgharị interlinear tụlee nsụgharị Bekee ọgbara ọhụrụ nke Bible.