Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 3/1 p. 7
  • Gịnị Mere Ha Ji Na-eme Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Ha Ji Na-eme Ya?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke 1998
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” nke 1999
    Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Mgbakọ—Ihe Ọṅụ Ndị Na-egosipụta na Anyị Bụ Òtù Ụmụnna
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Mgbakọ Distrikti Na-enyere Anyị Aka Ịghọtakwu Eziokwu Dị na Baịbụl
    Ozi Alaeze Anyi—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 3/1 p. 7

Gịnị Mere Ha Ji Na-eme Ya?

KWA afọ ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa na-ezukọ ná mgbakọ dị iche iche. N’ebe ahụ, ha na-enwe mkpakọrịta ma na-anụrụ usoro ihe omume magburu onwe ya nke ntụziaka Bible. Ụfọdụ na-eme mgbalị dị ukwuu iji gaa mgbakọ ndị a. Dị ka ihe atụ, n’afọ gara aga na Malawi otu di na nwunye nọ n’etiti afọ ndị 60 ha, tinyere nwa ha nwoke na nwunye ya na nwa ọhụrụ, ji ịnyịnya ígwè mee njem kilomita 80 iji gaa otu mgbakọ. Ha hapụrụ obodo ha n’elekere anya isii nke ụtụtụ ma rute n’ala mgbakọ mgbe hour 15 gasịrị.

Na Mozambique, otu ìgwè jiri ịnyịnya ígwè mee njem ụbọchị atọ iji garuo otu mgbakọ. N’otu abalị, ka ha mara ụlọ ntu n’èzí, ha nụrụ ka ọdụm na-agbọ ụja na nso ebe ahụ. Ọ bụ ezie na ha tụrụ nkụ n’akụkụ ebe ụmụ anụ ahụ nọ, ọdụm ndị ahụ nọgidere gburugburu ebe ahụ ruo mgbe chi bọrọ. Onyeàmà ọzọ nke na-aga otu mgbakọ ahụ zutere ọdụm ihu na ihu n’ụzọ. O guzoro jụụ n’emegharịghị ahụ ruo mgbe ọdụm ahụ pụrụ. Ná mgbakọ ahụ Ndịàmà a ji obi ụtọ kọọ otú e siworo ‘dọpụta ha n’ọnụ ọdụm.’—2 Timoti 4:17.

Ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova na-eme mgbalị dị ukwuu iji gaa mgbakọ ma ọ bụ ọbụna nzukọ ọgbakọ kwa izu maka ofufe. N’ihi gịnị? Isiokwu ndị na-esonụ ga-enyere gị aka ịghọta ihe mere ịgbakọta ọnụ ji dị oké mkpa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya