Meri Ọ̀ Nwụrụ Ọnwụ Nkịtị?
DỊ KA akwụkwọ akụkọ Vatican bụ́ L’Osservatore Romano si kwuo, ozizi Katọlik bụ́ Assumption na-ekwu, sị: “E bugoro Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke nke Na-enweghị Mmehie, bụ́ onye e chebere pụọ ná ntụpọ nile nke mmehie mbụ ahụ, n’anụ ahụ na mkpụrụ obi gaa n’ebube nke eluigwe, mgbe ndụ ya n’elu ala gwụsịrị.” Nkụzi a edujewo ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik n’ịzọrọ na Meri “anwụghị anwụ nakwa na a kpọliri ya ngwa ngwa site ná ndụ n’elu ala gaa n’ebube nke eluigwe,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu.a
N’oge na-adịbeghị anya, Popu John Paul nke Abụọ nyere nkọwa dị iche n’okwu ahụ. Ná Nnọkọ Ezumezu e nwere na Vatican na June 25, 1997, o kwuru, sị: “Agba Ọhụrụ enyeghị ihe ọmụma ọ bụla n’ọnọdụ ndị metụtara ọnwụ Meri. Ịgbachi nkịtị a na-eduje mmadụ iwere ya na o mere n’ụzọ nkịtị, n’enweghị nkọwa pụrụ iche e kwesịrị ịkpọtụ uche. . . . Echiche ndị na-achọ ịgụpụ ya n’onye nwụrụ ọnwụ nkịtị yiri ihe na-enweghị ebe ndabere.”
Okwu Popu John Paul kpughere ntụpọ dị ukwuu n’ozizi nke Ntụrụ Ime n’Enweghị Mmehie. Ọ bụrụ na nne Jisọs bụ onye “e chebere pụọ ná ntụpọ nile nke mmehie mbụ ahụ,” olee otú Meri pụrụ isi nwụọ “ọnwụ nkịtị,” bụ́ nke sitere ná mmehie e bufere site n’aka Adam mere mmehie? (Ndị Rom 5:12) Ọnọdụ a nke amaghị nke a ga-esonyere ná nkà mmụta okpukpe bụ n’ihi echiche gbagọrọ agbagọ nke Chọọchị Katọlik nwere banyere nne Jisọs. Ka a sịkwa ihe mere na nkewa na ọgba aghara ebilitewo n’etiti Chọọchị Katọlik n’ihi okwu ahụ.
Ọ bụ ezie na Bible na-egosipụta Meri dị ka onye dị obi umeala, onye kwesịrị ntụkwasị obi, na onye ji okpukpe kpọrọ ihe, ọ dịghị asị na àgwà ndị a bụ n’ihi “ntụrụ ime n’enweghị mmehie.” (Luk 1:38; Ọrụ 1:13, 14) Bible na-ekwu nnọọ, sị: “Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Ee, Meri ketara mmehie na ezughị okè dịkwa ka ihe fọdụrụ n’ihe a kpọrọ mmadụ ketara, e nweghịkwa ihe àmà na-egosi na ọ nwụrụ site n’ihe ọ bụla ọzọ ma ọ bụghị ọnwụ nkịtị.—Tụlee 1 Jọn 1:8-10.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Ozizi Assumption—Ọ̀ Bụ Nkwenkwe nke Chineke Kpughere?” n’Ụlọ Nche nke February 15, 1994, peji nke 26-29.