Agha nke Bibiri Narị Afọ nke 19
N’ỊTỤGHARỊ uche na narị afọ iri ọhụrụ ahụ, Charley Reese, bụ́ onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Orlando Sentinel dere, sị: “Agha 1914-1918 nke bibiri narị afọ nke 19 akwụsịbeghị.” Gịnị ka o bu n’uche? Ọ kọwara, sị: “Kalenda adịghị achịkwa akụkọ ihe mere eme ma ọlị. Narị afọ nke 19—nke a kọwara dị ka usoro nkwenkwe, echiche, àgwà na ụkpụrụ omume—ejedebeghị na January 1, 1901. O jedebere na 1914. Nke ahụ bụkwa mgbe narị afọ nke 20, a kọwara n’otu ụzọ ahụ, malitere. . . .
“Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọgụ nile ndị metụtaworo anyị ná ndụ anyị nile sitere n’agha ahụ. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ihe nile ndị si n’ọgụgụ isi na n’ọdịbendị pụta ndị anyị nagideworo sitere n’agha ahụ. . . .
“M chere na o wetara mbibi dị otú ahụ n’ihi na o mebiri nkwenkwe ndị mmadụ nwere na ụmụ mmadụ pụrụ ịchịkwa akara aka ha. . . . Agha ahụ mere ka ndị mmadụ gbahapụ nkwenkwe ahụ. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị ahụ na-alụrịta agha chere na ọ ga-eme otú o siri mee. O bibiri alaeze ukwu Britain na nke France. O gburu ihe ka ukwuu n’ọgbọ dum nke ndị ikom Britain, France na Germany. . . . Ná mkpirikpi oge, o gburu nde mmadụ 11.”
Ruo ihe karịrị afọ 120, Ndịàmà Jehova arụtụwo 1914 aka dị ka ngwụsị nke ihe Jisọs kpọrọ “oge nke mba ọzọ.” (Luk 21:24) N’afọ ahụ, e mere ka Jisọs Kraịst ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie, onye e buliwokwara elu nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze nke Alaeze eluigwe. Site n’Alaeze ahụ, Jehova Chineke ga-ewepụ nhụjuanya nile ndị e jiworo mara narị afọ a kpam kpam.—Abụ Ọma 37:10, 11; Eklisiastis 8:9; Mkpughe 21:3, 4.
1914
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]
U.S. National Archives photo