Àgwàetiti Dịpụrụ Adịpụ, Dịkwa Obere
NKỌWAAHA ndị a na-ejikarị akọwa àgwàetiti St. Helena bụ “dịpụrụ adịpụ” na “obere.” Nke ahụ dabara adaba, n’ihi na àgwàetiti a, nke dị kilomita 17 n’ogologo na kilomita 10 n’obosara, dị kilomita 1,950 site n’ala kasị dị nso, bụ́ ụsọ oké osimiri nke ebe ndịda ọdịda anyanwụ Africa. Ọ bụ n’ebe a ka e zigara Napoléon Bonaparte na 1815 ibi ruo mgbe ọ nwụrụ dị ka onye e meriri emeri nọ n’ala ọzọ.
Site n’oké osimiri, àgwàetiti ahụ na-eyi ebe e wusiri ike. Ọ bụ n’ezie ugwu mgbawa nke na-adịkwaghị ike nke selitere elu site n’Atlantic, na-enwe oké ugwu ndị ruru mita 500 ruo 700 n’ịdị elu. N’etiti ya, Ugwu Actaeon, nke dị mita 818, guzo n’ụzọ pụtara ìhè n’àgwàetiti ahụ nile. N’ihi ikuku jụrụ oyi nke Ndịda Atlantic na mmiri oké osimiri na-ekwo ekwo, àgwàetiti ahụ nwere ihu igwe dị jụụ, dịkwa mma. Ma site n’ikperé mmiri ahụ dị ala ruo n’ime ime àgwàetiti ahụ bụ́ ugwu ugwu, e nwere ihu igwe na ahịhịa ndụ dịgasị iche.
St. Helena adịwo n’aka ndị Britain kemgbe ngwụsị narị afọ nke 17. Ụba mmadụ ahụ dị nta nke dị ihe dị ka 5,000 bụ ngwakọta nke ndị si Europe, Esia, na Africa. Asụsụ Bekee ka e ji eme ihe n’àgwàetiti ahụ nile, ma a na-eji ụda asụsụ dị iche asụ ya. E nweghị ọdụ ụgbọelu n’ebe a; nanị ụzọ e si aga ná mba ndị ọzọ bụ ụgbọ mmiri, bụ́ nke na-aga South Africa na England mgbe dum. N’ezie, ọ bụ nanị n’etiti afọ ndị 1990 ka a malitere inwe usoro mgbasa ozi telivishọn, n’ihi usoro nzipụ ozi site n’ụzarị nke e tinyere.
Ná mmalite afọ ndị 1930, ozi ọma Alaeze Chineke rutere n’àgwàetiti a na nke mbụ ya. (Matiu 24:14) N’ime ọtụtụ afọ ndị gafeworonụ, ọtụtụ ndị bi n’àgwàetiti a enwetawo akụ̀ a nke na-eme ka ụba ihe onwunwe ghara ịdị mkpa. (Matiu 6:19, 20) Taa, St. Helena na-enwe nkezi pụrụ iche nke otu Onyeàmà nye mmadụ 31 ọ bụla, bụ́ nke kasị mma n’ụwa!
[Map ndị dị na peeji 24]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
St. Helena
JAMESTOWN
Levelwood
AFRICA
OKÉ OSIMIRI ATLANTIC
St. Helena