Ị̀ Na-eche Echiche Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye?
Ọ bụrụ na anyị ejiri ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm a na-enwe gburugburu ụwa tụnyere ala ọma jijiji, United States ga-anọ n’isi. N’otu afọ na-adịbeghị anya, e tisara ihe karịrị otu nde alụmdi na nwunye n’ebe ahụ—nkezi nke abụọ n’otu minit ọ bụla. Ma ọ pụrụ ịbụ na ị maara nke ọma na ọ bụghị nanị United States nọ ná nsogbu alụmdi na nwunye.
DỊ KA otu ihe ọmụmụ si dị, ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm na Canada, England na Wales, France, Gris, na Netherlands amụbawo karịa okpukpu abụọ kemgbe 1970.
Anyị nwere nnọọ ihe mere anyị ga-eji ekwere na ihe ka ukwuu ná ndị di na nwunye na-abanye n’alụmdi na nwunye n’ihi na ha hụrụ ibe ha n’anya ma chọọ ibikọ ọnụ ná ndụ ha nile. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ọchịchọ inwe alụmdi na nwunye obi ụtọ na-abụkarị nnọọ ịmụ anya arọ nrọ. Mgbe anya doro ha, ọtụtụ asịwo na ha lụrụ nnọọ di ma ọ bụ nwunye na nwata ma ọ bụ na ha lụrụ onye na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ ha abụọ.
N’ihi gịnị ka ọtụtụ alụmdi na nwunye ji adakpọ? “Isi ihe na-akpata ya bụ emeghị nkwadebe,” ka onye dere otu akwụkwọ banyere mbedo na-ekwu. Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ka mụ na di na nwunye ndị nọ na-enwe nsogbu alụmdi na nwunye na-emekọ ihe, mmetụta abụọ na-erikpu m—ọmịiko na iwe. Ana m enwe ọmịiko n’ihi na ọchịchọ ha maka mmekọrịta na-eju afọ erubeghị ha aka. Ana m ewe iwe n’ihi ọmụma ha na-amaghị ịdị mgbagwoju anya nke ọrụ ahụ.”
N’ezie, ọtụtụ na-abanye n’alụmdi na nwunye n’enweghị ihe ọmụma banyere otú ha pụrụ isi mee ka ọ gaa nke ọma. Ma, nke a abụghị ihe ijuanya. Otu onye ọkà nkụzi kwuru, sị: “Ndị ntorobịa anyị ole na-aga kọleji mụọ banyere akparamàgwà òké na ngwere, ma hapụ ịmụ banyere akparamàgwà mmadụ abụọ a kpọrọ di na nwunye?”
Ị̀ na-eche echiche banyere alụmdi na nwunye—banyere di ma ọ bụ nwunye ị pụrụ ịlụ n’ọdịnihu ma ọ bụ banyere alụmdi na nwunye ahụ ị nọ na ya ugbu a? Ọ bụrụ otú ahụ, i kwesịrị ịmara na mmekọrịta a na-enwe n’ezie dị nnọọ iche na ndị a na-egosi n’ihe nkiri sinima, n’ihe ngosi telivishọn, na n’akwụkwọ mmekọrịta ịhụnanya. Ka o sina dị, a pụrụ iwere alụmdi na nwunye nke mmadụ abụọ tozuru okè, bụ́ ndị hụrụ onwe ha n’anya n’ezie, dị ka ngọzi sitere n’aka Chineke. (Ilu 18:22; 19:14) Oleezi otú ị pụrụ isi jide n’aka na ị dị njikere imezu ihe ndị a na-achọ n’alụmdi na nwunye? Ihe ndị dị aṅaa ka i kwesịrị ịtụle n’ịhọrọ onye òtù ọlụlụ? Ma ọ bụ ọ bụrụ na ị lụworị di ma ọ bụ nwunye, olee otú ị pụrụ isi mee ka i nwee ike nwetakwuo obi ụtọ na-adịgide adịgide n’alụmdi na nwunye gị?