Ụbọchị A Ga-echeta
N’anyasị ahụ tupu ọ nwụọ, Jisọs bunyere ndị ozi ya otu ogbe achịcha na-ekoghị eko na iko mmanya ma nye ha ntụziaka ka ha rie ma ṅụọ. Ọ gwakwara ha, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”—Luk 22:19.
N’afọ a ememe ncheta nke ihe omume a dabara na Thursday, April 1, mgbe anyanwụ dasịrị. Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa ga-ezukọ n’anyasị a pụrụ iche iji mee Ememe Ncheta nke a n’ụzọ Jisọs nyere n’iwu. E ji nnọọ ikpo ọkụ na-akpọ gị òkù isonyere anyị. Biko jụta Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị maka kpọmkwem oge na ebe a ga-enwe nzukọ a pụrụ iche.