Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ime Nkwusa ‘n’Oge Kwesịrị na n’Oge Na-ekwesịghị’
MGBE agha tiwapụrụ ná mba Bosnia na Herzegovina, ọtụtụ puku nwetara ihe isi ike ndị kpụ ọkụ n’ọnụ. N’oge ule ahụ, Ndịàmà Jehova mere mgbalị nile iji wetara ndị mmadụ agbamume na olileanya. Ihe ndị na-esonụ bụ akụkụ ụfọdụ nke otu akwụkwọ ozi nke otu Onyeàmà jere ozi na Sarajevo ruo oge ụfọdụ dere.
“Ndụ siri ike n’ebe a, ma ndị mmadụ na-aṅa nnọọ ntị n’eziokwu Bible. Ndịàmà nọ n’ógbè a bụ ihe nlereanya dị egwu nke ịnọgidesi ike. N’ụzọ ihe onwunwe, ha nwere nnọọ obere, ma ha nwere mmụọ magburu onwe ya. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ndị na-eto eto nile nọ n’ọgbakọ dị n’ebe a nọ n’ozi oge nile. Ndị nkwusa ọhụrụ na-enweta agbamume site n’ịnụ ọkụ n’obi a, ọ bụghịkwa ihe ọhụrụ n’ebe ha nọ itinye awa 60 ma ọ bụ karịa n’ọnwa n’ozi ubi malite nnọọ n’ọnwa mbụ ha n’ozi.
“E wezụga ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị anwalewo ụzọ ndị ọzọ dị iche iche isi jekwuru ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, anyị arụpụtawo ezi ihe n’ikesa mbipụta Bible n’ọtụtụ ebe a na-eli ozu n’obodo ukwu.
“A gbawokwa àmà n’ụlọ ọgwụ dị iche iche. Ná Ngalaba Na-ahụ Banyere Obi nke otu ụlọ ọgwụ dị na Sarajevo, onyeisi ndị dibịa bekee naara Teta! nke December 8, 1996, nke isiokwu dị n’ihu ya bụ ‘Nkụchi Obi—Gịnị Ka A Pụrụ Ime?’ Ọ rịọrọ ka e wetakwuoro ya Teta! ahụ ka ya wee nwee ike ikesara ya dọkịta ndị ọzọ. Mgbe ahụ, e nyere Ndịàmà ahụ ikike ileta ndị ọrịa nile nọ ná ngalaba ya. N’ihi ya, n’ime ihe ji nke nta karịa otu awa, e kesara ihe karịrị 100 magazin site n’otu ihe ndina gaa n’ọzọ. Ọtụtụ ndị ọrịa kwuru na ọ bụ nke mbụ onye ọ bụla letaworo ha n’ụlọ ọgwụ iji nye ha agbamume na olileanya.
“N’oge ọzọ, e ji isiokwu magazin ndị kwesịrị ekwesị maka ụmụaka leta Ngalaba Na-ahụ Maka Ụmụaka. Onyeisi ndị dibịa bekee natakwara Akwukwọm nke Akukọ Bible ole na ole maka ọnụ ụlọ ịgụ ihe. Ugbu a ndị nne bụ́ ndị na-eleta ụmụ ha n’ụlọ ọgwụ ahụ na-agụrụ ha akụkọ Bible kwa ụbọchị. E mewokwa ndokwa ịkpọtụrụ dọkịta a n’ụlọ ya.
“Na Sarajevo, e nwere ọtụtụ puku ndị soja nke NATO [Òtù Nkwekọrịta nke Ebe Ugwu Atlantic] si ná mba dị iche iche. A gbawokwara ndị a àmà zuru ezu. Mgbe ụfọdụ anyị na-aga site n’otu ụgbọala agha gaa n’ọzọ na-eji akwụkwọ nta bụ́ Good News for All Nations gụnyere magazin Ụlọ Nche na Teta! n’asụsụ dị iche iche. E kesara ihe karịrị 200 magazin n’ogige ndị agha Itali. N’ụzọ na-eju nnọọ anya, ọtụtụ ndị soja Itali kwuru na ha na Ndịàmà Jehova ekwurịtatụbeghị okwu. Anyị kpọtụụrụ ha na Sarajevo.
“Otu ụbọchị otu ụgbọala agha kwụsịrị n’akụkụ ụzọ. Eji m nche anwụ m kụtụ ụgbọala agha ahụ, otu soja pụtara. Enyefere m ya otu Ụlọ Nche nke isiokwu dị n’ihu ya bụ ‘Ndị Ozi nke Udo—Hà Bụ́ Ole Ndị?’ Onye soja ahụ lere m anya ma jụọ, sị, ‘Ị bụghị otu n’ime Ndịàmà Jehova, ị̀ bụ?’ Mgbe ọ matasịrị na m bụ, ọ zaghachiri, sị, ‘Ọ dịkwa egwu; unu nọkwa ebe a! Ọ̀ dịkwa ebe Ndịàmà na-anọghị n’ụwa a?’”
Pọl onyeozi gbara ume, sị: “Kwusaa okwu Ya; tụkwasị uche n’ọrụ gị n’oge kwesịrị, ma ọ bụ n’oge na-ekwesịghị.” (2 Timoti 4:2) Dị ka ndị kwere ekwe ibe ha gburugburu ụwa, Ndịàmà Jehova nọ na Sarajevo na-eme nke ahụ, ọbụna site n’ihe ndina gaa n’ọzọ, sitekwa n’ụgbọala agha gaa n’ọzọ!