Ndị Ọchịchị Etoo Ndịàmà
NA Cádiz, Spain, bụ́ obodo nwere ọdụ ụgbọ mmiri nke dị ihe dị ka kilomita 500 n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ Madrid, onyeisi obodo ahụ bụ́ Doña Teófila Martínez nyere Ndịàmà Jehova otu ihe ncheta (nke e sere n’elu). Ọ na-agụ, sị: “Gọọmenti obodo Cádiz nye Ndịàmà Jehova n’igosi ekele maka enyemaka na mgbalị ndị ha na-eme n’ihi obodo a.” Gịnị ka Ndịàmà mere nke mere ha ji nweta nsọpụrụ a?
E nyere ya iji gosi na a hụrụ ọrụ Ndịàmà rụworo n’ịrụzigharị akụkụ ụfọdụ nke ámá egwuregwu obodo ahụ. Ruo ọtụtụ ngwụsị izu, ọtụtụ narị Ndịàmà wepụtara onwe ha n’afọ ofufo iji nye aka ịrụzigharị ụlọ mposi ndị dị n’ụlọ nke ala ala nke ámá egwuregwu bọl nke Carranza. Ugbu a, ndị nile ji ámá egwuregwu ahụ eme ihe na-erite uru site na paịpụ, ngwá ndị metụtara paịpụ mmiri, na ala ya bụ́ ndị e dozigharịrị.
Ruo oge ụfọdụ, Ndịàmà Jehova na obodo Cádiz enwewo ezi mmekọrịta. Kwa afọ, gọọmenti obodo ahụ na-eji obiọma enye Ndịàmà Ámá Egwuregwu Carranza maka mgbakọ distrikti ha na-enwe kwa afọ. Ya mere, Ndịàmà nwere obi ụtọ ime ihe ha pụrụ ime iji nye aka ime ka ámá egwuregwu ahụ dị mma.
Otú ọ dị, tụkwasị n’ọrụ ọkpụkpụ aka ndị ha na-arụ site n’oge ruo n’oge, Ndịàmà Jehova na-eleta ndị bi gburugburu obodo ahụ mgbe nile iji kwadoo ọha na eze n’ụzọ ọzọ. Ha na-akpọsa “ozi ọma” Alaeze Chineke. N’ezie, ha adịghị eje ozi ihu ọha ha iji nata otuto n’aka ndị mmadụ. Ha na-eme ya ná nrubeisi nye iwu Jisọs bụ́ ikwusa ‘ozi ọma alaeze eluigwe’ na ‘ime mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.’ (Matiu 24:14; 28:19) N’ụzọ dị otú a, Ndịàmà Jehova nwere olileanya ijere ọha na eze ozi site n’izi ndị mmadụ ihe “n’ụzọ ezi omume.”—Ilu 12:28.