Ichekwa Ezi Aha
IJI nlezianya nyochaa ihe osise mara mma pụrụ ịbụ ahụmahụ uru dị na ya. N’ileru anya nke ọma, mmadụ pụrụ ịhụ otú onye ọkà n’ise ihe si jiri brọsh tee àgwà dị iche iche n’ákwà ise ihe ọtụtụ ugboro.
N’otu aka ahụ, a na-enweta ezi aha, ọ bụghị site n’iji brọsh tee àgwà otu ugboro n’ụzọ basara abasa, dị ka a pụrụ ikwu ya, kama site n’ọtụtụ ntakịrị omume ndị e mere ruo oge ụfọdụ. Ee, nke nta nke nta anyị na-enweta ihe e ji mara anyị site n’omume ndị anyị na-eme.
N’aka nke ọzọ, otu àgwà e jiri brọsh tee n’ebe a na-ekwesịghị ite ya pụrụ ibelata ịma mma nke ihe e sere ese. Otú ahụ ka ọ dị n’ihe banyere aha anyị. Eze Solomọn maara ihe kwuru, sị: “Uche gbagọrọ agbagọ nke mmadụ na-ekpu ụzọ ya ihu.” (Ilu 19:3) Ihe ọ na-ewe bụ ntakịrị ihe a sị na ọ bụ uche gbagọrọ agbagọ—ikekwe ntiwapụ nke iwe ọkụ, aṅụrụma, ma ọ bụ otu omume na-adịghị ọcha nke mmekọahụ—iji tetọọ aha ọma. (Ilu 6:32; 14:17; 20:1) Ya mere, lee ka o si dị mkpa ka anyị gbalịsie ike inweta ezi aha, jirikwa ịdị uchu rụọ ọrụ iji chekwaa ya.—Tụlee Mkpughe 3:5.