Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 7/15 p. 32
  • Ihe Nduzi n’Ịhọrọ Ezi Ndị Enyi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Nduzi n’Ịhọrọ Ezi Ndị Enyi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 7/15 p. 32

Ihe Nduzi n’Ịhọrọ Ezi Ndị Enyi

NDỊ na-eto eto na-adabere n’ebe ndị ọgbọ ha nọ maka nduzi n’ihe metụtara uwe na egwú kama ịbụ n’ebe ndị mụrụ ha nọ, ka otu akụkọ dị na Reader’s Digest na-ekwu. Ya mere ọ dị mkpa ka ndị nne na nna mara ndị ha na ụmụ ha na-akpakọ na ebe ha na-akpaga.

“Ọ bụ ibu ọrụ unu ime nnyocha,” ka Esmé van Rensburg, bụ́ onye nkuzi ukwu ná ngalaba na-ahụ maka nkà mmụta akparamàgwà mmadụ n’otu mahadum dị na South Africa, na-ekwu. Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ma eleghị anya, ụmụ unu ga-ewesa unu iwe, ma ha ga-adajụ.” Mgbe ahụ, ọ tụpenyere ndị nne na nna azụ̀ n’ụzọ na-esonụ. Ụkpụrụ nduzi kwesịrị ịbụ ndị ezi uche dị na ha na ndị nwere nzube doro anya e ji nye ha; ṅaanụ ụmụ unu ntị; unu emeghachila omume gabiga ókè, kama nọrọnụ nwayọọ, marakwanụ ihe unu chọrọ ikwu. Ọ bụrụ na nwa unu emeelarị onye unu na-achọghị enyi, lekwasịnụ anya n’àgwà ọjọọ ọbụbụenyi ahụ kwaliteworo kama nanị ikwu ka ha ghara isokwa ya na-enwe mkpakọrịta.

Ezi ndụmọdụ maka ndị nne na nna adịworị n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, eri oge. Dị ka ihe atụ, ọ na-ekwu, sị: “Bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu, na-adịghịkwa ngwa iwe iwe.” (Jemes 1:19) Akwụkwọ Nsọ na-enyekwa ndụmọdụ a magburu onwe ya n’ihe metụtara ịhọrọ ndị enyi: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Ihe atụ ndị a na-egosi amamihe dịịrị ndị ahụ ji nghọta na-agụ Bible ma na-etinye ihe ọ na-ekwu n’ọrụ ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya