Ndụ Ọ̀ Dị Gị Ụtọ?
“KA M hụ ìhè.” Okwu ndị a ka a kọrọ na onye Itali na-ede uri bụ́ Giacomo Leopardi gwara ndị na-elekọta ya kpọmkwem tupu ọ nwụọ. Okwu ndị ahụ na-egosi oké ihe mmadụ ji ndụ kpọrọ, bụ́ nke ìhè na-anọchite anya ya.
Iji ndụ kpọrọ oké ihe bụ ihe mkpali dị oké ọnụ ahịa e bu pụta ụwa nke na-akwali ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ ịgbanahụ ihe ize ndụ na ime ihe nile ha pụrụ ime iji nọgide na-adị ndụ. Na nke a, mmadụ adịchaghị iche n’ebe ụmụ anụmanụ nọ, bụ́ ndị nwekwara ikike ebumpụta ụwa siri ike nke ịgbanahụ ihe ize ndụ.
Ma olee ụdị ndụ kwesịrị obibi na nke a ga-eji kpọrọ ihe n’ezie? Ọ bụghị ịdị adị nkịtị n’ụzọ anụ ahụ—nanị iku ume na ịgagharị agagharị. Afọ ojuju zuru ezu adịghịkwa abịa site n’inwe omume nke fọọ fọjuo akpa ná ndụ. Nkà ihe ọmụma ndị Epikurean bụ́, “ka anyị rie ṅụọkwa, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ,” ewetabeghịrị ndị mmadụ afọ ojuju ọtụtụ mgbe. (1 Ndị Kọrint 15:32) Ọ bụ ezie na mmadụ nwere ọtụtụ mkpa ihe onwunwe ndị bụ́ isi, o nwekwara mmasị n’ihe ndị metụtara ọdịbendị na ọha na eze, tinyere mkpa ime mmụọ, nke e jikọtara ya na okwukwe n’ebe Onye Kachasị Elu nọ. N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ narị nde mmadụ, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọtụtụ ijeri mmadụ, bụ nanị ịdị adị nkịtị ka ha dị n’ihi ọnọdụ ọha na eze na nke gburugburu ebe obibi ndị jọgburu onwe ha n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa. Ndị ọ bụla mere ka ndụ ha chee ihu nanị n’igbo mkpa anụ ahụ ha—iri nri, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, inweta ihe onwunwe, ma ọ bụ imeju ọchịchọ mmekọahụ—na-ebitụ ndụ anụmanụ, bụ́ nke na-enye ha afọ ojuju dị nnọọ nta. N’ụzọ dị otú a, ha adịghị eji ihe ndị ka nwee nzube ndị ndụ na-enye eme ihe iji mejuo ọchịchọ nke ọgụgụ isi na nke mmetụta uche ha. Ọzọkwa, ọ bụghị nanị na ndị ọ bụla na-achọ imeju nanị ọchịchọ nke onwe ha adịghị enweta ihe kasị mma ná ndụ kamakwa ha na-emebi obodo ha bi na ya, ha adịghịkwa akwalite ọdịmma nke ndị ọzọ.
N’ịkwado nke a, otu ọkàikpe na-ahụ maka ndị na-eto eto dara iwu na-ekwu na “nsogbu nke amaghị ihe ndị bara uru, ibuli ndị nlereanya na-adịghị mma elu, na ihe ịga nke ọma site n’usoro ịba ọgaranya ọkụ ọkụ,” yiri ka hà “na-akwalite mmụọ asọmpi gabigara ókè.” Nke a na-eduga n’akparamàgwà na-emebi obodo, na-ebibikwa ndị ntorobia, nke ka nke mgbe ha malitere ịṅụ ọgwụ ọjọọ.
Ị maara na ndụ nwere ọtụtụ ihe na-adọrọ mmasị—ịga ezumike n’ebe ndị na-adọrọ adọrọ, ịgụ ihe ma ọ bụ ime nnyocha ndị na-akpali akpali, mkpakọrịta na-enye obi ụtọ, egwú dị ụtọ. E nwekwara ihe omume ndị ọzọ na-eweta afọ ojuju ma nke ukwu ma nke nta. Ndị nwere okwukwe siri ike n’ebe Chineke nọ, karịsịakwa n’ebe Chineke nke Bible, bụ́ Jehova, nọ, nwekwuru ihe ndị mere ndụ ga-eji dị ha ụtọ. Ezi okwukwe bụ isi iyi nke ume na ịdị jụụ nke pụrụ inyere ndị mmadụ aka ịnagide oge ndị tara akpụ. Ndị kweere n’ezi Chineke ahụ pụrụ iji obi ike kwuo, sị: “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka; m gaghị atụ egwu.” (Ndị Hibru 13:6) Ndị maara ịhụnanya Chineke na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị ọ hụrụ n’anya. Ha na-azaghachi n’ịhụnanya ya, na-enweta ọṅụ dị ukwuu site na ya. (1 Jọn 4:7, 8, 16) Ha pụrụ ibi ndụ nke iji ọrụ n’aka na nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị nke bụ́ isi iyi nke afọ ojuju. Ọ bụ nnọọ dị ka Jisọs Kraịst kwuru: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa inara ihe.”—Ọrụ 20:35.
N’ụzọ dị mwute, e nwere akụkụ ọzọ ná ndụ a na-adị ugbu a. E nwere nhụjuanya, ikpe na-ezighị ezi, ịda ogbenye, ọrịa, na ọnwụ bụ́ ndị zuru ebe nile—iji hotagodị nanị ihe ụfọdụ na-akpata ihe mgbu bụ́ ndị na-emekarị ka ndụ bụrụ ihe siri ike nnagide. Eze Solomon nke bara ọgaranya, dị ike, marakwa ihe, nke Israel oge ochie nwere ihe nile na-eme mmadụ obi ụtọ. Ma, ọ dị ihe nyere ya nsogbu—ịmara na n’ọnwụ, ọ ga-ahapụrụ onye ọzọ ihe nile ‘ndọgbu ya,’ nke “[o mere] n’amamihe, na n’ihe ọmụma, na n’izi ezi,” wetawooro ya.—Eklisiastis 2:17-21.
Dị ka Solomon, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ maara banyere ịdị mkpụmkpụ nke ndụ, bụ́ nke na-agabiga nnọọ ngwa ngwa. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na Chineke ‘etinyewo mgbe ebighị ebi n’ime uche anyị.’ (Eklisiastis 3:11, Byington) Echiche a banyere mgbe ebighị ebi na-akpali mmadụ ịtụgharị uche n’ịdị mkpụmkpụ nke ndụ. N’ikpeazụ, n’achọtaghị azịza ndị na-eju afọ banyere nzube nke ndụ na ọnwụ, mmadụ pụrụ ịghọ onye e ji mmetụta nke enweghị nchekwube na ịbụ ihe efu bogbuo. Nke a pụrụ ime ka ndụ dị mwute.
È nwere azịza nye ajụjụ ndị na-emekpa mmadụ ahụ? Ọ̀ dị mgbe a ga-enwe ọnọdụ ndị ga-eme ka ndụ bụrụ ihe na-adọrọ adọrọ ma na-adịgide adịgide karị?