Ha “Na-atụ Egwu Chineke”
KA ỤMỤ Israel bụ ohu n’Ijipt, e tinyere ndị inyom Hibru na-ele ime bụ́ Shifra na Pua n’ọnọdụ tara akpụ. Ná mgbalị iji chịkwaa oké mmụba nke ọnụ ọgụgụ ndị ala ọzọ, Fero nyere ndị inyom a iwu, sị: “Mgbe unu na-ele ime ndị inyom Hibru, . . . ọ bụrụ na nwa nwoke ka ọ bụ, unu ga-emekwa ka ọ nwụọ.”—Ọpụpụ 1:15, 16.
Shifra na Pua “na-atụ egwu Chineke,” n’ihi ya ha nwere obi ike, “ha emeghịkwa dị ka eze Ijipt gwara ha.” Kama nke ahụ, ha debere ụmụ ndị ikom ahụ a mụrụ ọhụrụ ndụ, ọ bụ ezie na omume obi ike a pụrụ itinyewo ha n’ihe ize ndụ. Jehova “[mere] ndị inyom [ahụ] na-ele ime mma,” ọ kwụghachikwara ha ụgwọ ọrụ n’ihi omume ha na-azọpụta ndụ.—Ọpụpụ 1:17-21.
Akụkọ a na-egosipụta ekele Jehova na-enwe n’ebe ndị na-ejere ya ozi nọ. Ọ pụrụ ilewo ihe Shifra na Pua mere anya, ọ bụ ezie na ọ bụ nke obi ike, dị ka obi ebere ụmụ mmadụ. E kwuwerị, ọ dịghị nwanyị isi zuru okè nke ga-egbu ụmụ ọhụrụ! Ma, obi abụọ adịghị ya na Jehova chetara na ụmụ mmadụ ụfọdụ, n’ihi egwu mmadụ, emewo omume ndị jọgburu onwe ha. Ọ maara na ọ bụghị nanị obiọma mmadụ kwaliri ndị inyom a na-ele ime kama ọ bụkwa egwu na nsọpụrụ Chineke.
Lee nnọọ ekele anyị pụrụ inwe n’ihi ijere Chineke nke na-arịba omume ikwesị ntụkwasị obi anyị ama, ozi! N’eziokwu, ikekwe ọ dịbeghị onye n’ime anyị nke cheworo ule nke okwukwe ahụ Shifra na Pua nwetara ihu. Ma, mgbe anyị guzosiri ike maka ezi ihe—ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ anyị, ma ọ bụ n’ọnọdụ ọ bụla ọzọ—Jehova adịghị ewere ezi ịhụnanya anyị dị ka ihe dị nta. N’ụzọ dị iche, ọ “[na-egosi] Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ee, “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị, ebe unu jeere ndị nsọ ozi, na-ejekwara ha ozi.”—Ndị Hibru 6:10.