“Ikike nke Àgwà nke Okwukwe Kpaliri”
N’AFỌ 1998, e wepụtara otu akwụkwọ ọhụrụ n’asụsụ French nke isiokwu ya bụ́ Les Témoins de Jéhovah face à Hitler (Ndịàmà Jehova n’Ihu Hitler), nke Guy Canonici dere, bụ́ nke e toro n’ụzọ dị ukwuu. N’okwu mbido ya n’akwụkwọ ahụ, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ onye France a na-akwanyere ùgwù bụ́ François Bédarida, dere, sị: “Nke a bụ akwụkwọ a kasị anabata. Ọ bụghị nanị n’ihi na ọ na-enye ihe ọmụma, kama n’ihi na ọ bịara n’oge kwesịrị ekwesị. . . . E wezụga ndị ọkachamara, olee ndị maara banyere nhụjuanya Ndịàmà Jehova nwere n’okpuru Alaeze Ukwu nke Atọ ahụ? Ma, n’ime ọchịchị afọ 12 ahụ dum, a kpagburu ha n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ na n’ụzọ ime ihe ike. Ha onwe ha kwa hụsiri anya n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. Ihe dị ukwuu funahụkwara ha n’ihi okwukwe na nkwenkwe ha. N’ihi gịnị ka e jiworo chefuo ndị Kraịst a n’akụkọ ihe mere eme? . . .
“N’ihi gịnị ka e ji kpagbuo otu obere òtù okpukpe gbasara ebe nile, nke na-adịghịkwa emerụ ahụ, n’ụzọ obi ọjọọ na-aga n’ihu otú ahụ? Nke a bụ isi ihe a ga-eleba anya n’ihe mgbagwoju anya ahụ. Ọ bụghị nanị na Ndịàmà nọ na Germany na-anọchite anya nanị ọnụ ọgụgụ dị nnọọ nta nke ndị bi ná mba ahụ—ndekọ ọnụ ọgụgụ na-egosi na ha dị ihe dị ka 20,000 n’ime ihe karịrị nde mmadụ 60 bi ná mba ahụ—ma ha nile bụ ụmụ amaala na-eme udo bụ́ ndị na-akwanyere iwu ùgwù, ha adịghịkwa eyi mmadụ ọ bụla egwu, nanị ihe ha na-achọ bụ ịrụ ọrụ ma zụlite ụmụ ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị. . . .
“Mkpagbu a biliri megide nguzogide ime mmụọ siri ike ma na-emeri emeri nke ndị na-ekpe okpukpe ahụ, bụ́ nke nwere ike iji ikike nke si n’ime bụ́ okwukwe ha nwere n’ebe Jisọs Kraịst nọ guzogide ikike nke nrụgide ndị si n’èzí, na-amalite ná mmeso ọjọọ nke ndị Ọchịchị aka ike—ruo n’ókè nke ịghọ ndị dike na ndị e gburu n’ihi okwukwe ha.”
Akụkọ banyere Ndịàmà Jehova e gburu n’ihi okwukwe ndị Kraịst ha n’ihi ekweghị ibe nọrọ nke okpukpe, bụ nke na-enwe mmetụta dị ukwuu. Ná ntụle ọ tụlere akwụkwọ ahụ, akwụkwọ akụkọ ndị Katọlik kasị ewu ewu na France, bụ́ La Croix, gbakwụnyere n’ụzọ na-emetụ n’ahụ, sị: “Banyere ntakịrị ihe mere eme a maara banyere ha, Guy Canonici achịkọtala ọtụtụ ihe àmà bụ́ ndị na-adịghị enye mmadụ ọnụ okwu mgbe ọ na-ahụ ikike nke àgwà nke okwukwe kpaliri bụ́ nke e gosipụtara n’okwu ndị kasị mfe, okwukwe nke a na-emebilighị ruo ọgwụgwụ ọbụna n’etiti ụmụaka. Ihe ncheta a kwesịrị inye ihe ndabere maka arụmụka ndị a na-enwe n’oge a banyere ọdịdị Ndịàmà Jehova dị ka ndị Kraịst.”