Jikere Maka Narị Afọ Iri nke Dị Mkpa!
ỌCHỊCHỊ Puku Afọ Kraịst ga-ewetara ezinụlọ ụmụ mmadụ ọtụtụ ngọzi. N’okpuru nduzi ịhụnanya Jisọs, a ga-ebuli ihe a kpọrọ mmadụ site n’ọnọdụ ọjọọ ha nọ n’ime ya ugbu a gaa n’ọnọdụ izu okè dị ebube. Cheedị echiche ihe nke ahụ pụrụ ịpụtara gị. Ahụ ike bụ ịgba! Cheedị banyere ibili n’ụra kwa ụtụtụ na-enwe ahụ ike dị mma karịa ụnyaahụ. Ọtụtụ nde ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka na-atụ anya ibi ndụ n’oge obi ụtọ ahụ. Ha na-atụsi anya ya ike, na-ekpe ekpere maka ya. Ọmụmụ ha na-amụ Bible emewo ka ha kwenye na ngọzi ndị a pụrụ ịbụ nke ha.
Otú ọ dị, tupu ọ malite Ọchịchị Puku Afọ ya, Jisọs Kraịst aghaghị ikpochapụ ndị nile na-emegide ịchịisi ya pụọ n’ụwa. Ọ ga-eme nke a n’agha a kpọrọ Amagedọn n’ime Bible. (Mkpughe 16:16) Ezi ndị Kraịst nọ n’ụwa agaghị alụ ọgụ n’agha ahụ. Ọ bụ agha Chineke. Ọ gaghịkwa abụ nanị n’otu ebe. Bible na-ekwu na ọ ga-eru na nsọtụ nile nke ụwa. A ga-egbu ndị na-emegide ịchịisi Kraịst. Ọ dịghị otu n’ime ha ga-alanarị!—Jeremaịa 25:33.
Mgbe ahụ Jisọs ga-eche ihu ya n’ebe Setan bụ́ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya nọ. Were uche gị lee otú ọ ga-adị, dị ka onye dere akwụkwọ Mkpughe si hụ ya: “M wee hụ mmụọ ozi [Jisọs Kraịst] ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, na-eji mkpịsị ugodi nke abyss ahụ n’aka ya, ya na oké mkpọrọ. O wee jide dragọn ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan, o wee kee ya agbụ [otu puku afọ].” (Mkpughe 20:1, 2) Mgbe e mesịrị, a ga-ebibi Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ruo mgbe ebighị ebi.—Matiu 25:41.
“Oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ,” ga-alanarị Amagedọn. (Mkpughe 7:9) Kraịst ga-eduru ndị a gaa n’iritezu uru site “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ,” dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ na-eduru atụrụ ya gaa ná mmiri na-azọpụta ndụ. (Mkpughe 7:17) N’abụghị ndị Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya gbochiri ọganihu ime mmụọ ha, a ga-eji nwayọọ nwayọọ na-enyere ndị a lanarịrị Amagedọn aka imeri ọchịchọ ime mmehie ha ruo mgbe ha ga-eru izu okè n’ikpeazụ!
N’okpuru ịchịisi ịhụnanya nke Kraịst, ọnọdụ ibi ndụ ga-anọgide na-adịwanye mma. Jehova Chineke, site n’aka Jisọs Kraịst, ga-ekpochapụ ihe nile na-akpata ahụ ụfụ na iru újú. Ọ “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.” (Mkpughe 21:4) Aịsaịa onye amụma kọwatọpụrụ ọnọdụ ahụ, na-ekwu, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.” (Aịsaịa 35:5, 6) Ndị nwụkwara anwụ, “ndị ukwu na ndị nta,” ga-adịghachi ndụ na-enwe olileanya nke ịnọ n’anwụghị anwụ ọzọ!—Mkpughe 20:12.
Ọbụna ugbu a, a na-achịkọta “oké ìgwè mmadụ” ahụ ga-alanarị Amagedọn. Ha na-ejikere maka Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst. Ọ bụ ezie na ha amaghị mgbe ọchịchị ahụ ga-amalite, ha nwere obi ike na n’oge nke Chineke, ọ ga-amalite. Ị pụrụ iso n’ime ha, ma gị onwe gị kwa aghaghị ijikere—ọ bụghị site n’ire ihe onwunwe gị ma gaa n’otu ebe, kama site n’inweta ezi ihe ọmụma banyere Jehova Chineke na nzube ya site n’ọmụmụ Bible. N’efughị gị ego, n’achọghịkwa ka i kwee nkwa ime ihe ọ bụla, Ndịàmà Jehova ga-eji obi ụtọ gosi gị otú ịmụ Bible pụrụ isi baara gị na ezinụlọ gị uru. Ndị na-ebipụta magazin a ga-enwe obi ụtọ inyekwu gị ihe ọmụma.
[Igbe dị na peeji nke 7]
Puku Afọ Ahụ—Ọ̀ Bụ nke Nkịtị Ka Ọ̀ Bụ nke Ihe Atụ?
Ebe e dere ihe ka ukwuu n’akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe n’okwu ihe atụ, otu ajụjụ na-ebilite. Gịnị banyere Ọchịchị Puku Afọ Kraịst ahụ e kwuru maka ya ná Mkpughe? Ọ̀ bụ oge nkịtị ka ọ̀ bụ oge ihe atụ?
E nwere ọtụtụ ihe na-egosi na e bu otu puku afọ nkịtị n’obi. Tụlee: Pọl onyeozi na-ezo aka n’Ọchịchị Puku Afọ Kraịst ahụ, bụ́ mgbe a ga-ekpe ihe a kpọrọ mmadụ ikpe, dị ka otu ụbọchị. (Ọrụ 17:31; Mkpughe 20:4) Pita onyeozi dere na otu ụbọchị (awa 24) dị ka otu puku afọ n’anya Jehova. (2 Pita 3:8) Nke ahụ ga-egosi na “ụbọchị” ikpe a dị otu puku afọ nkịtị n’ogologo. Ọzọkwa, ná Mkpughe 20:3, 5-7, anyị na-agụ ugboro anọ dịgasị iche banyere, ọ bụghị “otu puku afọ,” kama banyere “[puku afọ ahụ].” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Nke a yiri ka ọ na-egosi ogologo oge a kapịrị ọnụ.