Bible Ọ̀ Pụrụ Inyere Anyị Aka Taa?
“N’OZUZU Bible, ọ bụ ihe dị ka 1 pasent kwesịrị ọgụgụ, ma ndị fọrọnụ abaghị uru, ha bụkwa ihe oge ha garala.” Otú ahụ ka otu nwa okorobịa kwuru. Ọtụtụ ndị ga-ekwenyere ya. Ọ bụ ezie na Bible nọgidere na-abụ akwụkwọ a kasị ere gburugburu ụwa, ọtụtụ nde adịghị elebachara ya anya, ha amaghịkwa ihe ndị ọ na-akụzi.
Ná mbipụta ya nke Krismas 1996, akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Süddeutsche Zeitung kwuru na “ọnụ ọgụgụ ndị na-agụ [Bible] na-adalata nnọọ adalata. N’ọgbọ nke nkà mmụta sayensị na ịrị elu nke emeghị ihe ndị metụtara okpukpe, ihe ndekọ Bible na-eyi ihe ọhụrụ na ihe siri ike nghọta nye ọtụtụ ndị.” Nnyocha ndị e mere na-akwado akụkọ a. Ụfọdụ nnyocha e mere na-ekpughe na ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ụmụaka amaghịdị kpọmkwem onye Jisọs bụ. N’otu nnyocha, ọ bụ ihe na-erughị ọkara nke ndị a gbara ajụjụ ọnụ pụrụ ịkọ akụkọ Bible ahụ na-ekwu banyere nwa mmefu na onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi.
Akwụkwọ Chọọchị Evangelical nke Switzerland na-ebipụta bụ́ Reformiertes Forum na-ekwu na na Switzerland, ndị mmadụ adịghịzi azụ Bible otú ha sibu azụ ya. Ọbụna n’etiti ndị nwere Bible, ọ na-ekpokarị nnọọ uzuzu na shelf ha. Ọnọdụ ahụ adịghị iche na Britain. Dị ka otu nnyocha si kwuo, ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ nwere Bible, ọ na-ara ahụ ọnụ ọgụgụ ka ukwuu agụtụ ya.
N’aka nke ọzọ, ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa nwere echiche dị iche banyere Bible. Ha na-ele ya anya dị ka Okwu Chineke ma na-ewere ya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa ma baa uru. N’ihi ya, ha na-agụchi ya anya. Otu nwa agbọghọ dere, sị: “Ana m agbalị ịgụ otu isiakwụkwọ Bible ma ọ bụ abụọ kwa ụbọchị. Ọ na-atọ m ụtọ nke ukwuu.” Ndị dị otú ahụ na-eji nlezianya arịba ihe Bible na-akụzi ama, ha na-agbalịkwa itinye ndụmọdụ ya n’ọrụ ná ndụ ha. Ha kwere na Bible pụrụ inyere ha aka n’ụwa taa nọ ná nsogbu.
Gịnị bụ echiche gị? Bible ọ̀ bụ ihe na-abaghị uru n’oge a? Ka ọ̀ dị oké ọnụ ahịa ma baa uru? Bible ọ̀ pụrụ inyere anyị aka taa?