Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 12/1 p. 25
  • Mgbasawanye Ọchịchị Chineke na Namibia

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbasawanye Ọchịchị Chineke na Namibia
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ebe E Kenyere Anyị Ozi Ala Ọzọ Ghọrọ Obodo Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 12/1 p. 25

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Mgbasawanye Ọchịchị Chineke na Namibia

OZI ọma Alaeze Chineke rutere Namibia na nke mbụ ya n’ọgwụgwụ afọ ndị 1920. Kemgbe ahụ, ọtụtụ narị ndị nwere obi eziokwu anabatala ozi nzọpụta nke Chineke. Ahụmahụ ndị na-esonụ na-egosi otú Jehova si achịkọbata ndị a a na-achọsi ike n’ime ìgwè atụrụ ya.—Hagaị 2:7.

◻ Mgbe mbụ Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ Paulus, bụ́ onye ọrụ ubi na-arụrụ afọ ya nke bi n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Namibia, bụ mgbe o letara Windhoek, bụ́ isi obodo ahụ. Paulus kwenyesiri ike ozugbo na ya achọtala eziokwu ahụ. O ji akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala laghachị n’ebe obibi ya. E mesịa, ka ọ nọ na-aga Rundu, bụ́ obodo kasị nso nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze, Paulus hụrụ Ndịàmà ma rịọ ha ka ha bịa leta ya.

Otú ọ dị, ebe ahụ dị anya nke ukwuu maka Ndịàmà ịbịa na-eduziri Paulus ọmụmụ Bible kwa izu. N’ịbụ onye a na-akụdaghị mmụọ, Paulus malitere ịmụrụ onwe ya Bible. Tụkwasị na nke a, o ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaara ndị ọzọ ihe ndị ọ na-amụta. Ka oge na-aga, e guzobere otu ìgwè ọmụmụ Bible. Mgbe ìgwè nta ahụ nụrụ na redio na a ga-enwe mgbakọ Ndịàmà Jehova na Rundu, ha tụkọtara obere ego ha kpatara ma mee ndokwa maka ụgbọ njem iji gaa.

Lee ahụmahụ na-akpali akpali ọ bụụrụ ha iso Ndịàmà Jehova kpakọrịta na nke mbụ ya! N’oge na-adịghị anya, e mere ndokwa maka ụmụnna ruru eru iletachi ìgwè a anya. Taa, e nwere ndị nkwusa isii n’obodo nta ahụ Paulus bi.

◻ Mmasị Johanna nwere n’ebe aha Chineke dị biiri ọkụ mgbe ọ nụrụ ka otu onye na-ekwu okwu ọjọọ banyere Ndịàmà Jehova. Ọ na-echeta, sị: “Kpọmkwem mgbe mbụ m nụrụ aha ahụ bụ́ Jehova, ọ banyere n’ime obi m n’ụzọ m na-apụghị ichefu echefu, amalitekwara m iche onye Jehova bụ. Mụ na di m bi na nso Walvis Bay n’ụsọ oké osimiri Namibia. N’otu oge anyị gara n’obodo ukwu, ahụkwara m ụfọdụ Ndịàmà ka ha na-ekesa magazin Ụlọ Nche n’okporo ámá. Enwetara m otu ma rịọ maka ọmụmụ Bible, ebe ọ bụ na m nwere ọtụtụ ajụjụ. Ebere m ákwá mgbe ha gwara m na ha apụghị ịbịa n’ihi na ụgbọala ha mebiri. Di m nwụrụ n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, agakwara m biri na Keetmanshoop. E kenyere otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche (onye na-ezisa ozi ọma oge nile) ịrụ ọrụ n’ebe ahụ, esikwa m n’aka ya nweta akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Neduba ná Ndu Ebigh-Ebi. Site ná mmalite ya, ahụrụ m na ọ bụ eziokwu.

“N’ikpeazụ, a kpọrọ m òkù ikere òkè n’ọrụ nkwusa, ma egwu mmadụ rikpuru m. Ka m na-aga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ, ekpegaara m Jehova ekpere ka o mee ka m nwụọ kama ikwe ka m mee nkwusa. Mgbe mbụ m keere òkè n’ịgba àmà okporo ámá, ezoro m onwe m n’otu ụzọ dị warara nke ahịhịa juru, na-enwe olileanya na ọ dịghị onye ga-ahụ m. N’ikpeazụ, ejisiri m ike gosi otu onye na-agafenụ otu magazin, ọ bụkwa nanị mgbe ahụ ka m jisiri ike kwuo okwu. N’ụbọchị ahụ, site n’enyemaka Jehova, eso m ọtụtụ mmadụ kerịta olileanya m dabeere na Bible.

“Taa, bụ́ afọ 12 kemgbe ahụ, ọ bụ ezie na m bụ ogbenye n’ụzọ ihe onwunwe, aka m ji ihe ùgwù nke ozi ọsụ ụzọ kpọrọ ihe ma nọgide na-enweta ọṅụ dị nnọọ ukwuu site n’iso ndị ọzọ na-ekerịta eziokwu Alaeze.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya