Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 12/1 p. 32
  • Imeri Ihe Ịma Aka nke Ịzụ Ụmụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Imeri Ihe Ịma Aka nke Ịzụ Ụmụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 12/1 p. 32

Imeri Ihe Ịma Aka nke Ịzụ Ụmụ

ỊZỤ ụmụ taa, nke ka nke ndị nọ n’afọ iri na ụma, bụ ihe ịma aka siri ike nye ndị mụrụ ụmụ. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Gazette nke Montreal, Canada, na-akọ na ịnwale mmanya na-aba n’anya na ọgwụ ọjọọ aghọọla “ihe ndị nọ n’oge uto na-emekarị.” Ọ na-emesi ya ike na ndị mụrụ ụmụ nwere “ibu ọrụ nke ịnọ na nche banyere mgbanwe ndị a na-enwe n’akparamàgwà nke ụmụaka [ha] ndị nọ n’afọ iri na ụma.”

Ihe dị aṅaa pụrụ igosipụta nsogbu oge uto ndị dị otú ahụ ka ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ilepụ anya maka ha? Ụfọdụ ihe mgbaàmà anụ ahụ, mmetụta uche, na nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke Ụlọ Akwụkwọ Na-ahụ Maka Ọrịa Uche Ụmụaka na nke Ndị Nọ n’Oge Uto nke America chọpụtara na-agụnye ike ọgwụgwụ na-adịte anya, mgbanwe n’àgwà na n’ọdịdị, ịkpọchigide onwe onye n’ime ụlọ ihi ụra ruo ogologo oge, ise okwu, na ịbụ onye na-abanye ná nsogbu n’ihi ịda iwu.

Olee otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi chebe ụmụ ha pụọ ná nnwale dị otú ahụ na-emerụ ahụ na ihe ndị dị njọ ọ na-arụpụta? Dr. Jeffrey L. Derevensky, nke Mahadum McGill, kweere na nkwurịta okwu ghere oghe na ịkwalite nkwanyerịta ùgwù n’oge nwata ka na-eto eto nwere ike ibelata nsogbu n’ikpeazụ. Akwụkwọ akụkọ ahụ bụ́ The Gazette na-agbakwụnye na ọ bụ ezie na ọchịchọ maka nnwere onwe ka ukwuu na-apụta ìhè n’oge uto, “nduzi, nkwado, nhazi na ịhụnanya sitere n’ebe ndị mụrụ ha nọ” na-anọgide na-adị ndị nọ n’afọ iri na ụma mkpa. Nchọpụta ndị a na-ekwughachi otu ilu Bible nke na-asị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.” (Ilu 22:6) Chineke na-enye ndị mụrụ ụmụ ndụmọdụ ịbụ ndị nlereanya, ndị enyi, ndị na-enwe nkwurịta okwu, na ndị nkụzi.—Deuterọnọmi 6:6, 7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya