Ndị Ọhụrụ So n’Òtù Na-achị Isi
NA Saturday, October 2, 1999, e ji otu ọkwa dị ịtụnanya mechie Nzukọ Kwa Afọ nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania. Mmadụ 10,594 bịaranụ ma ọ bụ ndị gere ihe omume ahụ site na telifon nwere mkpali ịnụ na a tụkwasịla mmadụ anọ ọhụrụ n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Ndị ọhụrụ ahụ, ndị bụcha ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ Samuel F. Herd; M. Stephen Lett; Guy H. Pierce; na Devid H. Splane.
• Samuel Herd malitere ịsụ ụzọ na 1958, sitekwa na 1965 ruo 1997, ọ rụrụ ọrụ sekit na distrikti. Mgbe nke ahụ gasịrị, ya na nwunye ya, bụ́ Gloria, abụwo akụkụ nke ezinụlọ Betel nke United States, bụ́ ebe Nwanna Herd nọworo na-arụ ọrụ ná Ngalaba Ije Ozi. Ọ nọkwa na-eje ozi dị ka onye na-enyere Kọmitii Ije Ozi aka.
• Stephen Lett malitere ịsụ ụzọ na December 1966, sitekwa na 1967 ruo 1971, o jere ozi na Betel dị na United States. N’October 1971, ọ lụrụ nwunye ya, bụ́ Susan, ma banye n’ozi ọsụ ụzọ pụrụ iche. Site na 1979 ruo 1998, o jere ozi dị ka onye nlekọta sekit. Kemgbe April 1998, ya na Susan abụwo akụkụ nke ezinụlọ Betel nke United States. N’ebe ahụ, o jewo ozi ná Ngalaba Ije Ozi ma bụrụ onye na-enyere Kọmitii Izi Ihe aka.
• Guy Pierce zụlitere ezinụlọ, e mesịakwa, ya na nwunye ya malitere ịsụ ụzọ n’April 1982. O jere ozi dị ka onye nlekọta sekit site na 1986 ruo 1997, bụ́ mgbe ya na nwunye ya, bụ́ Penny, ghọrọ akụkụ nke ezinụlọ Betel dị na United States. Nwanna Pierce anọwo na-eje ozi dị ka onye na-enyere Kọmmitii Ndị Ọrụ aka.
• David Splane malitere ịsụ ụzọ na September 1963. N’ịbụ onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke 42 nke Gilead, o jere ozi dị ka onye ozi ala ọzọ na Senegal, Africa, e mesịa, ọ rụrụ ọrụ sekit ruo afọ 19 na Canada. Ya na nwunye ya, bụ́ Linda, anọwo na Betel dị na United States kemgbe 1990, bụ́ ebe Nwanna Splane rụworo ọrụ ná Ngalaba Ije Ozi na nke Ide Ihe. Kemgbe 1998, ọ bụwo onye na-enyere Kọmitii Ide Ihe aka.
Tinyere mmadụ anọ ọhụrụ ahụ, ndị mejupụtara Òtù Na-achị Isi ugbu a bụ C. W. Barber, J. E. Barr, M. G. Henschel, G. Lösch, T. Jaracz, K. F. Klein, A. D. Schroeder, L. A. Swingle, na D. Sydlik. Ọ bụ ekpere mmadụ nile na Jehova ga-anọgide na-agọzi ma na-ewusi Òtù Na-achị Isi ike, bụ́ nke a mụbara ugbu a, ka ọ na-anọgide na-elekọta ọrụ ndị Chineke bụ́ ndị ha na-arụ gburugburu ụwa ma na-eje ozi maka ọdịmma ime mmụọ ha.