Afọ Pụrụ Iche Maka Nkesa Bible
IHE ka ọtụtụ ná ndị mmadụ nwere Bible karịa ka ọ dịtụworo. Nke ahụ bụ ihe akụkọ sitere n’aka United Bible Societies na-enye echiche ya, n’ihi na nkesa Bible ji ihe karịrị ọkara nde rịa elu na 1998 karịa n’afọ bu ya ụzọ. N’ozuzu, e kesara ihe karịrị Bible 585,000,000—n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ—gburugburu ụwa. “Nke a bụ ihe na-enye agbamume,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. “A na-eji Okwu Chineke ejekwuru ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ ka ukwuu taa.”
N’ezie, e nwere ọdịiche dị n’etiti inwe Bible na ịgụ ya agụ. Dị ka ihe atụ, otu nnyocha e mere kpughere na ihe karịrị pasent 90 nke ndị America nwere ma ọ dịkarịa ala otu Bible, ọnụ ọgụgụ hakwa otú ahụ kweere na Bible bụ isi iyi dị mma nke ozizi omume ọma. Otú ọ dị, nanị pasent 59 sịrị na ha na-echigharịkwuru Bible maka ndụmọdụ. Pasent 29 kwetakwara na ha ‘amachaghị’ ma ọ bụ na ha amaghị Bible “ma ọlị.”
Ọ bụghị nanị na Ndịàmà Jehova na-ebipụta ma na-ekesa Bible kamakwa ha na-eduziri ndị mmadụ ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu n’ihe karịrị ala 230. Ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa na-erite uru ugbu a site n’usoro nkụzi Bible a. A na-enyere ha aka ịnagide nsogbu ndị ha na-eche ihu ugbu a, ha na-amụtakwa ihe Bible na-ekwu banyere ọdịnihu mara mma n’okpuru Alaeze Chineke.—Aịsaịa 48:17, 18; Matiu 6:9, 10.
[Foto ndị dị na peeji nke 32]
Ọmụmụ Bible ebe obibi na (site n’elu elu aka ekpe gaa n’aka nri) Bolivia, Ghana, Sri Lanka, na England