Ụmụ Mmadụ—Hà Bụ Nanị Ụmụ Anụmanụ Ndị Nwere Ọgụgụ Isi?
“Ihe anyị kweere banyere mmalite nke ndụ ọ̀ dị ihe ọ bụla o mere?”
Otu nwa agbọghọ dị afọ 16 nke bi Brazil jụrụ ajụjụ a ná mmalite nke okwu ya n’isiokwu bụ́ “Ụmụ Mmadụ—Hà Bụ Nanị Ụmụ Anụmanụ Ndị Nwere Ọgụgụ Isi?” Mgbe onye nkụzi ya natasịrị otu Teta! (Bekee) nke June 22, 1998 bụ́ nke dabeere n’isiokwu ahụ, onye nkụzi ahụ kpọrọ nwata akwụkwọ a ka ọ gwa klas ya okwu n’isiokwu ahụ.
Onyeàmà ahụ na-eto eto mere ka ọ pụta ìhè otú ozizi evolushọn, nke dabeere ná nhọrọ ebumpụta ụwa, siworo nnọọ bụrụ ihe na-eweta ọdachi. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-eche na nchepụta echiche evolushọn dugara ụfọdụ ndị ile nnọọ agha anya dị ka akụkụ ebumpụta ụwa nke ndọga na-adịru ebighị ebi a na-adọga maka nlanarị, bụ́ nke nyere aka dozie ụzọ maka mwulite nke ọchịchị aka ike Fascist na nke ndị Nazi.
Nwata akwụkwọ ahụ gosipụtara na e nwere nnukwu ọdịiche dị n’etiti ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ. O kwuru, sị: “Ọ bụ nanị ụmụ mmadụ pụrụ ịzụlite ọnọdụ ime mmụọ. Nanị ụmụ mmadụ na-anwa ịchọpụta nzube nke ndụ. Nanị ụmụ mmadụ ka ọnwụ na-enye nsogbu n’obi, nanị ha na-enwe nchegbu banyere otú ha si malite, nanị ha na-enwekwa ọchịchọ ịdị ndụ ebighị ebi. Lee ka o si dị mkpa ka anyị wepụta oge iji chọpụtatụkwuo otú anyị si malite!”
Onye nkụzi ahụ jara ọmarịcha okwu ahụ mma. O kwuru na ihe kpatara ihe ịga nke ọma ya bụ eziokwu ahụ bụ́ na Onyeàmà a na-eto eto na-enwe mmasị n’ịgụ ihe. A maara nwa agbọghọ ahụ n’ụlọ akwụkwọ dị ka onye na-eji mmasị agụ mbipụta ndị dabeere na Bible dị ka Teta! na Ụlọ Nche.
Ndịàmà Jehova na-enwe nchegbu sitere n’ezi obi banyere mmetụta nchepụta echiche evolushọn na-enwe n’obi na n’uche ndị na-eto eto. N’ihi nke a, ọgbakọ nwa agbọghọ a so na ya gbara Ndịàmà na-eto eto ume inye ndị nkụzi ha na ụmụ akwụkwọ ibe ha magazin Teta! (Bekee) nke June 22, 1998. E kesara ihe dị ka magazin 230 n’ụlọ akwụkwọ dị iche iche n’obodo ahụ. Onyeisi Ngalaba Sayensị n’otu ụlọ akwụkwọ natara ụtụ magazin Teta!
Ee, ihe anyị kweere banyere mmalite nke ndụ dị ihe o mere! Onye a na-eto eto na ndị enyi ya egosipụtawo na ikwere na Chineke emewo ka ndụ ha dị iche n’ezie.